ASỤSỤ IGBO NA ATỤMANYA NTOLITE YA (IGBO LANGUAGE AND THE PROSPECTS OF GROWTH)

Authors

  • BASILIA NKECHINYERE EWEOMA (Ph.D) Imo State Schools System
  • CHINENYE .C. OLEKAIBE (Ph.D) Federal University of Technology, Owerri
  • AMAJOYI GRACE NGOZI (Ph.D) Department of Igbo Imo State College of Education, Ihitte Uboma
  • NDUKA PERPETUA UGOCHI Federal University of Technology, Owerri

Abstract

so n’otu ọkpụrụkpụ ihe zuru mba niile ọnụ. Ọ bụ ụzọ obibi ndụ nke mmadụ na ibe ya si ekwurịta okwu ma na-agwarịta onwe ha ebumnuuche ha. Asụsụ Igbo dị oke mkpa na ndụ ndị Igbo maka ọ bụ isi ihe e ji ama onye Igbo nke e kwesịrị inye ugwu na nsọpụrụ. ọ bụ otu n’ime ọkpụrụkpụ asụsụ atọ (Awụsa, Igbo, Yoruba) dị n’ala Naịjirịa. Ndị Igbo niile na-asụ asụsụ Igbo. Ndị Igbo mejupụtara mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa. Ha bụ ndị gbasiri ike ma na-agbasi mbọ ike n’ịrụ ọrụ. Igbo bụ aha agbụrụ ma bụrụkwa aha asụsụ ha. Dịka ọ dị n’ụbọchị taa, ndị mmadụ na-eche ma na-ekwukwa na asụsụ Igbo anyụọla ka ọkụ. Ụfọdụ ndị Igbo ejizighị asụsụ Igbo kpọrọ ihe. Ọ na-alazi azụ n’ike n’ike, n’ụlọakwụkwọ, n’ụlọnzukọ, n’ọgbọ ọha, n’ahịa ma nke na-ewute karịchaa bụ n’ezinaụlọ ndị Igbo ebe ha tụhapụrụ ya ma kpụrụ asụsụ ndị mba ọzọ n’ọnụ. Ọ bụ nke a mere nchọcha a jiri hiwe isi n’asụsụ Igbo na ụzọ a tụrụ anya ọ ga-esi etolitekwa ọzọ ma bụrụ ọkaibe n’asụsụ ndị ọzọ e nwere. E lebara anya na ndị bụ ndị Igbo ma na-asụkwa asụsụ Igbo, mkpa asụsụ Igbo dị, ọnọdụ asụsụ Igbo n’ụbọchị taa. A chọpụtara mkpọbi ụkwụ asụsụ Igbo nwere ma depụta ihe ndị a ga-elekwasị anya mee ka o wee tolitekwa ọzọ. Dịka: ndị mụrụ ụmụ ijiri asụsụ Igbo amalite ịkụziri ụmụ ha asụsụ, ka ndị gọọmenti nye ezi nchekwa banyere asụsụ Igbo, ndị gọọmenti inye aka hazie ihe ọmụmụ ọgbakọ nkụzi ihe maka ụzọ nkwalite asụsụ Igbo nakwa ndị ọzọ. Nchọcha a ga-abara ọha ndị Igbo uru, ụmụakwụkwọ nakwa ndị ọzọ ndị na-eme nchọcha n’ihe banyere ọganiihu asụsụ Igbo.

Downloads

Published

2024-08-22