NSIRIHụNDụ NDị IGBO GBASARA AGAMNIHU
Abstract
Ndị Igbo bụ ndị e ji ịgba mbọ were mara. Ịgba mbọ ndị Igbo bụ ụzọ ha si ezipụta nkwenye ha na ezi ọrụ nwere ụgwọ nke na-apụta ihe n’ilu Igbo dị iche iche dị ka, “Aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ”, “Onye rụọ o rie”, “Nwata kwọchaa aka, o soro okenye rie nri”, dg. Mana ọ bụ ihe mwute na oke ịgba mbọ ọtụtụ ndị Igbo n’ọgbọ dị ugbua na-edubanyezi ha n’ịkpa arụ dị iche iche iji sonye na ndị a na-ahụta dị ka ndị nwere agamnihu. A na-ahụ ụdị ajọ akparamaagwa ha na-akpa iji nweta akụ na ụba dị ka: igbu mmadụ were gwọọ ọgwụ ego, ịtọ na ire mmadụ na ndị ọzọ. Ebumnobi nchọcha a bụ ime ka a mata na Igbo hụrụ ịgba mbọ na agamnihu n’anya ma ha kpọrọ ịchụ akụ na ụba n’ụzọ ezighị ezi asị. Ederede a ga-enye aka mee ka nsogbu na-apụta n’ịchụ akụ na ụba ọnwụ ọnwụ juru n’ala Igbo belata mekwa ka ụwa ghara ịdị na-ahụtazi ndị Igbo dị ka agbụrụ hụbigara akụ na ụba n’anya oke. A ga-esite n’ụzọ dị etu a weghachi ezi agamnihu n’ala Igbo. Nchọcha a gbasoro usoro nkọwapụta. E jikwa atụtụ ezi akparamaagwa were tụchaa ya. Nchọpụta gosiri na nghọtahie nkwanye ugwu a na-enye ndị nwere ego, anya ukwu, e jighịzi “ezi aha ka ego” kpọrọ ihe na ndị ọzọ so n’ihe na-ebute oke ịchụ na ịhụ akụ na ụba n’anya jupụtara n’ala Igbo. Odee na-atụ aro ka ndị Igbo laghachi azụ na nkwenye ha ndị na-akwalite agamnihu site n’ịgba mbọ nye aka na-akụnye mkpụrụ agbam mbọ na ndụ ndị na-etolite etolite.Downloads
Published
2024-08-22