M ̀YÌNÀÀBỤ ́Ọ ̅ N’IME MKPỌAHA: USORO ̀ MBAWANYE MKPỤRỤOKWU I ̀GBO ̀

Authors

  • JOY EBERECHUKWU UMEOKOLO Department of Igbo, African and Communication Studies Nnamdi Azikiwe University, Awka
  • GEORGE E. ONWUDIWE (Prof.) Department of Igbo, African and Communication Studies Nnamdi Azikiwe University, Awka
  • AGHAEGBUNA HAROLDSON UWAEZUOKE Department of Linguistics Nnamdi Azikiwe University, Awka

Abstract

Mmebeokwu ọ bụla n'asụsụ Igbo na-agbaso usoro mbịakọta ọnụ nke mkpụrụasụsụ ole na ole, nke na-arụtụ aka n’isiokwu a bụ "M ̀yìnààbụ ́ọ ̅ n’ime Mkpọaha: Usoro Mbawanye mkpụrụokwu Igbo". Myìnààbụō nke so n'otu n’usoro mmebeokwu Igbo na-egosipụta etu e si agba okwu nje ya bụ mgbe a na-ezipụta nghọta okwu site n’ime ka okwu ahụ niile bịa ugboro abụọ ma ọ bụ ụfọdụ n’ime okwu ahụ ịgbanwe. Nke a na-ewebatakwa mbawanye na mkpụrụokwu Igbo. Nkọwa nke a mere ka anyị mata na myìnààbụō pụtara ihe ụzọ abụọ. Ha bụ myìnààbụō mpe na myìnààbụō nzu bụ ihe anyị ga-eleba anya ya na nchọcha a. Myìnààbụō nzu bụ usoro idenwe mkpụrụokwu niile ebe myìnààbụō mpe bụ usoro idenwe ụfọdụ mkpụrụokwu, ya bụ ndenwe mkpụrụokwu nke zuru oke na nke ezughị oke. Ebumnoobi kpalitere nchọcha a bụ: ịkọwapụta myìnààbụō Mpe na Myìnààbụō Nzu, nangosipụta m ̀yinààbụ ́ọ ̅ kemkpọaha ndị gbara nje n’ahankọwa, ahankwuwa, ụdaụda, ahaucheụda na aha - nọmba. Site na nsogbu ma ọ bụ ihe mgbawoju anya kacha pụta ihe n’ụdịdị m ̀yinààbụ ́ọ ̅ abụọ e nwere n’asụsụ Igbo mere o jiri dị mkpa izipụta ndịiche dị na myìnààbụō mpe na myìnààbụō nzu dị ka: ojije, orire na opupu, ọpụpụ wdg. na itinye ha n'ọrụ. Nchọcha a, gosipụtara na asụsụ Igbo nwere ọtụtụ nzipụta myìnààbụō. A gbadoro ụkwụ n'atụtụ “Ndokọ Mmebeokwu” nke Jackendoff hiwere n'afọ 1975 wee tụchaa ngwa nchọcha a. Atụtụ a, bụ nke e jiri wee gosipụta ebe ụdịdị myìnààbụō isii ndị a na-adị ire site n'izipụta ndịiche ha. A chọpụtara na nchọcha ndịọzọ na nke a abụghị otu ihe. O nweghịkwa nke ji atụtụ nchọcha a wee rụọọrụ. Nchọpụta a gosiri ebe myìnààbụō na-agbaso ndakọrịta ụdaume. Site na ngosipụta nchọcha a, imirikiti mmadụ agaghị enwe ihe mgbagwoju anya ọzọ n'ihe banyere izipụta myìnààbụō mpe na myìnààbụō nzu n'asụsụ Igbo. Mmezu ebumnuche ide edemede a nyere odee obi aṅụrị n’ihi na o wedewere mmụta na mpaghara a nso n’ebe ndị na-amụ ihe gbasara ụtọasụsụ nke mmebeokwu, karịsịa nke asụsụ Igbo.

Downloads

Published

2024-08-22 — Updated on 2024-09-02

Versions