NGANUSORO DỊ KA ỌCHỊKWA NA NHỌRỌ NGWAA NA MMEJU

Authors

  • Ilechukwu, Daniel Ihunanya Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka na Nzikọrịtaozi MahadumNnamdị Azikiwe, Ọka

Abstract

Ụmị Ederede Asụsụ ọ bụla nwere usoro na iwu ọ na-agbaso na mmebe mkpụrụokwu na usorookwu. Igbo nwere iwu na-achịkwa ngakọrịta mkpụrụ ụda na ibe ya, ngakọrita mkpụrụ okwu na ibe ya, ngakọrịta usoro okwu na ibe ya, d.g. Ọ bụ iwu ndị ahụ na-achịkwa ngakọrịta ngwaa na mmeju ka e nyochara n’ọrụ a kpọmkwem. Nsogbu kpaliri nchọcha a bụ na ndị na-asụ Igbo na-agwakọrịta Igbo izugbe na olu ndị na ndokọ ngwaa na mmeju. Mbunuche izugbe nchọcha a bụ ịhazi etu ngwaa na okwu ga-emeju ya kwesịrị isi gakọ dị ka o si metụta Igbo izugbe na olundị. Atụtụ a gbasoro mee nchọcha a bụ atụtu ndokọ mkpụrụokwu nke De saussre (1916). A kọwara ihe bụ nganusoro na njirimara ya. E zipụtakwara etu nganusoro si apụta ihe n’asụsụ Igbo. A chọpụtara n’ikpe azụ na ndokọ okwu bụ ebe nhibe isi ụtọ asụsụ ebe ngalaba echiche okwu na-adabere na ya iji nwee nghọta zuru oke. A na-atụ aro na ndị ga-eme nchọcha na nganusoro n’ọdịnihu ga-emetụ aka na nganusoro metụtara mkpọaha, ngwaa na mmeju

Downloads

Published

2024-07-08