NZIPỤTA MPỤTARA ASỤSỤ ÒTÙ ỤMỤAKWỤKWỌ A HỌỌRỌ NA STEETI IMO

Authors

  • Ọlachi Florence Okere Ngalaba Amụmamụ Asụsụ Ala Naịjirịa na Lingwistiks, Alvan Ikoku Fedral Kọleeji Keedukeshọn, Owere
  • Florence Uju Ibeh (Ph.D) Department Of Igbo, African And Communication Studies Nnamdi Azikiwe University, Awka

Keywords:

Mpụtara, Asụsụ òtù na Asụsụ Igbo

Abstract

Ụmịedemede Asụsụ bụ ndụ mba ọbụla. Asụsụ ọbụla dị ndụ na-eto eto. Ọ bụkwanụ site n’inwete okwu ọhụrụ dị iche iche ka asụsụ si eto ma baa ụba. A bịa n’ihe banyere asụsụ òtù ndị e nwegasịrị, ha juru eju bara abara. Asụsụ ndị a nwere ike ịbụ asụsụ ndị òtù nzuzo, asụsụ ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ, asụsụ ndị uweojii, asụsụ ndị dibịa Bekee, asụsụ ndị abalị dị égwù, asụsụ ndị ọkaikpe, asụsụ ndị nkuzi, asụsụ ndị ọrụ n’ọbaego, wdg. Mana edemede a gbakwasịrị ụkwụ sọọsọ n’asụsụ òtù ụmụakwụkwọ Ihe kpaliri mmụọ nchọcha bụ ihe ahụ na-ekewapụ mmadụ na ibe ya ịghọta asụsụ ọzọ n’abụghị asụsụ izugbe. Mbunuuche nchọcha a bụ ịchọpụta ihe mere ndị òtù a ụmụakwụkwọ ji akparịta ụka n’asụsụ òtù ha, ọ kachasị mgbe ha nọkọtara ọnụ. Nchọcha a bụ nke usoro nkọwasị ma jiri tụmbọm tụmbọm họrọ ndị a gbara ajụjụọnụ. Atụtụ a gbasoro mee nchọcha a bụ atụtụ njirime nke Ludwig Wittgenstein tụpụtara n’afọ 1953 nke naakọwa na aha ọ bụla agbụrụ nyere okwu ga-abụzi mpụtara okwu ahụ. N’ikpeazụ, a chọpụtara na ihe kpatara ndị òtù a ji asụsụ òtù ha akpagasị nkata n’etiti onwe ha oge niile bụ ka ha nwee ike zonahi ndị mmadu okwu ndị ha achọghị ka ndị ọzọ mata. Nchọpụta ọzọ bụ na asụsụ òtù na-abawanye akpaokwu asụsụ Igbo. A chọpụtakwara na asụsụ òtù nwere ike ibute nnupụ isi n’usoro ọsụsụ asụsụ izugbe. A pịachiri edemede a site n’ịtụ alo ka ụmụakwụkwọ ndị a jisie ike na-eji asụsụ òtù ha ndị a gasị na nkata ha na-akpagasị oge ọ bụla maka mmụbanye akpaokwu asụsụ Igbo.

Downloads

Published

2024-07-08