AMAGHỊ NTỤGHARỊ: AKAMGBA NYERE MGBASAOZI N’ASỤSỤ IGBO N’ỤWA ỌHỤRỤ

Authors

  • Ifunanya Nzubechukwu Dimebo Department of Linguistics and Nigerian Languages Alex-Ekwueme Federal University, Ndufu-Alike Ikwo

Keywords:

Asụsụ, Ntụgharị, Mgbasaozi,Akamgba, na Ụwa ọhụrụ.

Abstract

Ụmịedemede Isiokwu nchọcha a bụ “Amaghị Ntụgharị: Akamgba nyere Mgbasaozi n’Asụsụ Igbo n’Ụwa Ọhụrụ” lebara anya n’otu n’ime ihe ndị na-ama mgbasaozi n’asụsụ Igbo aka n’ihu n’ụwa ọhụrụ. Ọ bụ nghọtahie ndị na-ege ntị na-enwe oge ọ bụla a na-agbasaozi n’asụsụ Igbo tụmadụ mgbe ha gechara nke Bekee kpaliri mmụọ ọchọcha ide edemede a. Ebumnobi edemede a bụ ịgba n’anwụ ka amaghị ntụgharị si eme ka akụkọ ụwa n’asụsụ Igbo na-ada aja aja nyeere ndị na-ege ntị ma kọwapụta ụzọ isi gbochie ma ọ bụ belata ọnọdụ dị otu a. Iji nweta ngwa e ji dee edemede a, ọchọcha gbara mmadụ iri atọ ajụjụ ọnụ nke gụnyere mmadụ iri na-arụ ọrụ n’ụlọ mgbasaozi na mmadụ iri abụọ ndị na-ege ntị na-esonye n’ihe mmemme a na-eme n’ụlọ mgbasaozi. A gbasoro usoro sọvee wee nwetakwa ihe ndị ọzọ nyere aka maka edemede a ma gbasoo usoro nkọwa were zipụta ha. A chọpụtara na ọtụtụ ndị na-agbasa ozi n’asụsụ Igbo bụ ndị amaghị asụsụ Igbo nke ọma ma ya fọdụzịa ịgụ ya dị ka e si agụ asụsụ ndị ọzọ na mahadum maka mgbasaozi. Edemede a ga-eme ka a ghọta ọnọdụ asụsụ Igbo na mgbasaozi ma were ya kpọrọ ihe. Ọ ga-abara Igbo niile uru ma mee ka ọnọdụ asụsụ Igbo gbagote tụmadụ na mgbasaozi.

Downloads

Published

2024-07-08