NKWABANYE N’ALỤMDI NA NWUNYE NA NSOGBU DỊ NA YA, DỊKA A HỤRỤ N’AKWỤKWỌ AGỤMAGỤ IGBO NDỊ A HỌỌRỌ
Abstract
Ụmịedemede Alụmdi na nwunye bụ ihe zuru ụwa niile ọnụ ebe nwoke na nwaanyị hụrụ onwe ha n’anya na-ekwekọrịta ka ha bụrụ otu site na nkwado ndi ezinaụlọ ha. Dịka ọ dị taa, oke ọchịchọ nakwa akpịrị ogologo emeela ka ndị mụrụ ụmụ kwabanye ụmụ ha n’ọlụlụ di nke na-ewetara ha nsogbu dị iche iche. Nkwabanye n’alụmdi na nwunye bụ nke a na-amanye mmadụ amanye ịlụ onye o nweghị mmasị na ya. A na-ejikarị oluike, iyiegwu nakwa nkwu ̣̀ kwù ̣ eme n’achọghị ịma ọghọm na-esi na ya apụta. Ọ bụ nke a kpaliri mmụọ onye nchọcha a nke ebumnuche ya bụ ịchọpụta ma ọ bụ eziokwu na nsogbu na-adị n’alụmdi na nwunye a kwabanyere mmadụ ịlụ. Ọ ga-achọpụtakwa isi sekpụ ntị na ya, nsọtụ ya nakwa ihe e nwere ike ime iji gbochie nsogbu ndị ahụ. Ọ bụ Agụmagụ Igbo atọ ka a gbadoro ụkwụ mee nchọcha a. Ha bụ: Ụkpaka Mịịrị Onye Ụbịam nke Ubesie (1981), Akpịrị Richie Ụzọ nke Obidiebube (2009) nakwa Adaakụ nke Mọgbọgụ (2011) dere. E sikwa n’ajụjụ ọnụ, n’ọba akwụkwọ nakwa n’ịntaneetị nweta ihe ndị nyere aka e ji dee edemede a. Ọ bụ usoro nke Sọvee Nchọcha nke Ezinaụlọ dị ugbu a nakwa nke Agụmagụ (Survey research approach of contemporary Families (Tourangeau 2009), ka a gbasoro mee nchọcha a. Ọ bụ Atụtụ Soshiọlọji nke alụmalụ nakwa agụmagụ nke Barnes na Howard (1940:329-430) ka a gbasoro mee nchọcha a. N’eziokwu, nchọcha a gbara n’anwụ nsogbu ọ na-eweta ndị gụnyere, mkpọrọmaasị, anyaukwu, enweghị afọ ojuju, ịgba n’ezi, ọnwụ nakwa ndị ọzọ. Ọ bụ ndị nne na nna bụ isi sekpụ ntị na nsogbu ndị ahụ, ebe nsọtụ ya na-abụkarị ọnwụ ike, mmebọ/mmetọ nakwa ịgba alụkwaghịm. A chịkọtara edemede a site n’inye ntụziaka ka ndị nne na nna kwụsị ịkwabanye ụmụ ha n’ịlụ onye na-abụghị obi ha kama ka a hapụ ha ka ha jiri aka ha chọta onye dị ha mma maka na Igbo sị na mmiri nwata kwọsara onwe ya n’oge ụgụrụ anaghị atụ ya oyiDownloads
Published
2024-07-08