ALỤMDI NA NWUNYE NA ỊGBA ALỤKWAGHỊM N’ALA IGBO N’OGE GBOO NA KA Ọ DỊ N’OGE UGBUA

Authors

  • Ann C. Onyekelu, PhD Department Of Igbo, Africa and Communication Studies Faculty of Arts Nnamdi Azikiwe University, Awka

Abstract

Ụmịedemede Alụmdi na nwunye n’ala Igbo dị ọkpọtọrọọkpụ nke na tupu nwoke na nwaanyị ebiri dịka di na nwunye, nwoke ahụ ga-eme ihe n’isi nwaanyị ahụ dịka omenala obodo sịrị dị nke gosiri na ọ lụọla nwaanyị ahụ. Ọ bụkwa eziokwu na ọtụtụ ụmụ nwoke anaghị eme ihe n’isi nwaanyị tupu ha ebiwe obibi di na nwunye mana nke a adabaghị n’usoro omenala ndị Igbo. Nsogbu kpaliri nchọcha a bụ ka ịgba alụkwaghịm na oke esemokwu siri jụpụta n’ọtụtu ezinaụlọ n’oge ugbua. Ebumnuche nchọcha a bụ ịchọpụta etu alụmnwaanyị dị n’oge gboo na ka ọ dị n’oge ugbua, iji mata ihe kpatara oke ịgba alụkwaghịm na oke esemokwu. E ji usoro nchọcha sọvee na ajụjụọnụ e depụtara n’akwụkwọ wee nweta ngwa ọrụ e jiri dee nchọcha a, nke a nyeere nwanchọcha aka ịchọpụta ihe dị iche n’alụmnwaanyị n’oge gboo na n’oge ugbua. Ọ bụ atụtụ kọmplimentariti nke Geoorge Isac wepụtara n’afọ 2000 ka a gbadoro ụkwụ mee nchọcha a. Ndị e jiri mee nchọcha a bụ ụmụnwoke na ụmụnwaanyị ndị lụrụla di na nwunye ọtụtụ afọ. Ihe a chọpụtara gosiri na n’oge gboo a na-agba njụ tupu a lụọ nwaanyị iji mara ma ezinaụlọ na agwa nke nwaanyị a na-achọ ịlụ ọ dịkwa mma. Ma n’oge ugbua, ihe a na-alụzi bụ mma àhụ́ n’agbanyeghị ihe ọjọọ ndị ọzọ dị n’ahụ nwaanyị ma n’ezinaụlọ o siri pụta. A chọpụtakwara na n’oge gboo, ọ bụ iwu na okenye ga-eso ga lụta nwaanyị mana n’oge ugbua, ụfọdụ ebirila be nwoke, mụọ nwa tupu e mewe ihe n’isi nwaanyị ahụ. A tụrụ anya na nchọcha a, ga-eme ka ndị ntorobịa na-alụ nwaanyị n’ụzọ ekwesịghị ekwesi kwusi ya. Site n’ihe a chọpụtara nwa nchọcha na-atụ arọ ka onye ọbụla nwere mmasị ịlụ di na nwunye, were akwụkwọ nchọcha a gụọ n’ihi na ọ ga-abụ ihe ntụzịaka iji belata ịgba alụkwaghịm n’ala Igbo n’oge ugbua.

Downloads

Published

2024-07-08