MKPATARA ENWEGHỊ EZI NCHEKWA N’AGỤMAGỤ NDỊ A HỌỌRỌ: ỌGHỌM NA-ESO YA

Authors

  • Juliet Ifunanya Okeyika Ngalaba Igbo, Afrịka na Nzikọrịtaozi Mahadum Nnamdi Azikiwe, Ọka
  • Nkechinyere Nwokoye Ngalaba Igbo, Afrịka na Nzikọrịtaozi Mahadum Nnamdi Azikiwe, Ọka

Abstract

Ụmịedemede Enweghị ezi nchekwa bụ ihe cheere onye ọ bụla na obodo aka mgba n’ihu n’oge ugbua. Ọ bụ ọnọdụ na-egosi na ezi nchekwa adịghị. E meela nchọcha dị iche iche metụtara enweghị ezi nchekwa etu o siri metụta obodo na ebe dị iche iche mana ebumnobi nchọcha a bụ iji agụmagụ abụọ; Anụ Gbaa Ajọ Ọsọ (nke Ọfọmata) na Ọkụkọ Ntị Ike (nke Okeke),wee zipụta etu ndị odee siri tulee ihe na-akpata enweghị ezi nchekwa n’akwụkwọ ha ndị a họọrọ. Ọzọ bụ ịchọpụta ọghọm ha zipụtara n’ime agụmagụ ha nke na-eso enweghị ezi nchekwa. Nchọcha a bụ nchọcha nkọwa. Ọ bụ atụtụ Saịkoanalisis ka a gbasoro wee mee nchọcha a. A maara na ọ bụ mmadụ ka a naarịa. Mmadụ na-eme, mmadụ ka a na-eme. Atụtụ Saịkoanalisis dabara na nchọcha a n’ihi na o nyere aka n’ileba anya n’etu ndị odee a họọrọ siri zipụta akparamaagwa ndị omekaome na-eme n’ihi na e nweghị ezi nchekwa n’obodo. Ọzọ bụ na o nyere aka n’ileba anya ihe kpatara ụdị agwa ha kpara nke butere enweghị ezi nchekwa dịka ọ dị n’agụmagụ ndị a họọrọ. A chọpụtara na enweghị ezi nchekwa enweghị ebe ọ dịghị. E nwekwara ihe na-akpata ya nke na-esi n’aka ndị omekaome. Ọzọ bụ na ọghọm na-eso ya bụ; ọnwụ, itufu akụnaụba, ịkwafụ ọbara, ịnọ n’oke ụjọ oge ọ bụla, emesapụghị ahụ na ịnọ n’iro. A chọpụtakwara dị ka etu ndị odee siri zipụta, na ihe na-eme ka ndị omekaome na-akpa mkpamkpa dị iche iche ndị na-eme na ezi nchekwa adịghị bụ; oke ọchịchọ, enweghị aka ọrụ, anya ufu, agụghị akwụkwọ na ihe isi ike. A na-atụ alo ka ọhanaeze mara na ezi nchekwa bụ oke na ọrụ dịịrị onye ọ bụla. Mmadụ ekwesịghị iche ka gọọmentị cheere ya ndụ ya nche n’ihi na onye arachaghị ọnụ ya, ụgụrụ arachaara ya. Nchọcha a ga-eme ka ndị ntorobịa mara na uru adịghị na tigbuo, zọgbụọ. Ọ gaemekwa ka ha wepụ aka ha n’ihe ọ bụla ga-eme ka enweghị ezi nchekwa dị n’obodo.

Downloads

Published

2024-07-08