NZIPỤTA AJỌ OBI NA NSOGBU YA N’AGỤMAGỤ ENYI MERE ENYI YA NA MMIRI ỌKỤ E JI EGBU MBE

Authors

  • Chioma Chiazom Anagor Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka na Nzikọrịtaozi Fakọlti NKe Aatị Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka

Abstract

Ụmịedemede ---------------------- Obi mmadụ bụ otu ihe zoro ezo nke anya mmadụ agaghị ahụ ihe dị n’ime ya maọbụ atụmatụ ọ chọrọ ịtụpụta oge ọbụla ọ na-awagharị, naanị onye nwe ya maara ihe naeme n’ime ya na ihe ọ na-eche. E nwere ụfọdụ atụmatụ ga-esi mmadụ n’obi pụta, o doo anya na ọ bụ atụmatụ ọjọọ ma nwekwaa nke bụ atụmatụ ọma mana edereede a chọrọ ịgbado ụkwụ na ajọ obi maọbụ obi ọjọọ dị ka ụfọdụ na-akpọ ya. Ajọ obi butere inye nsi, nwanne igbu nwanne, iwepụ ndụ maka ọgwụ ego dg. Nke a mere ederede a jiri lebaa anya n’otu akwụkwọ ejije na otu iduuazị iji hụta ka ndị odee si ziputa ajọ obi, ihe kpatara ya, ọghọm ọ na-ebute na ụzọ e nwere ike isi gbochie ya. A gbasoro usoro nkọwa ma were atụtụ ime mmụọ nke Sigmund Freud tụpụtara n’afọ 1856-1939 wee tụchaa agụmagụ ndị a iji mee ka isiokwu a doo anya. A chọpụtara na ọtụtụ ndị mmadụ bụ enweghị afọ ojuju na ndụ ha na anyaukwu dubara ha iche ajọ echiche ebe mmadụ ibe ha nọ ma na-eziputa ya n’omume ha. Ụfọdụ bụkwa ndị obi na-afụ ụfụ ma ha hụ onye ọzọ ka ọ na-enwe obi aṅụrị. Ya mere o ji dị mkpa ndị mmadụ ịkpachapụ anya n’ụdị enyi ha na-enwe na ndị ha na-akọọrọ ihe tụmadị ihe ọma na-eme na ndụ ha makana ọchị abụghị ụtọ.

Downloads

Published

2024-07-08