EMUME NGABIGA ỤMỤAKA N’OMENAALA IGBO
Keywords:
Emume Ngabiga, Ụmụaka, Omenaala, IgboAbstract
Ụmịedemede ---------------------- Emume ngabiga ụmụaka bụ mmemme ndị ahụ a na-emere ụmụaka n’ala Igbo iji hụ na nwata bụ onye zuru oke dị mma ịnabata n’etiti ọhanaeze. Ebumnobi nchọcha a bụ ka e zipụta emume ngabiga ndị a na-emere ụmụaka n’ala Igbo dị ka ili otubo, ihe na-eso nwa nakwa uru ha bara. Ọ bụghị asị ma e kwuo na omenaala Igbo nọ n’ọnụ ọnwụ, ọ bụ nke a kpalitere mmụọ onye nchọcha a ka e were detuo omenaala ndị a n’akwụkwọ ka ọgbọ na-abịa n’ihu nwee ike gụọ ya n’ihi na imerime ụmụafọ Igbo amaghị ihe gbasara isiokwu a. Ọ bụ eziokwu na ndị ọkammụta dị iche iche edelarịị ọtụtụ akwụkwọ n’omenaala Igbo, mana edemede a na-gbakwasị ụkwụ naanị n’emume ngabiga ụmụaka n’omenaala Igbo iji wepụtacha tịịtịị na rịịrịị niile dị n’emume a. Nchọcha a bụ nke a gbasoro usoro nnyocha mee n’obodo Ọgwụ dị na Steeti Enugwu. A gbara ndị mmadụ ajụjụọnụ iji chọpụta ihe ha maara gbasara emume ndị a ma tụlekwa ihe e derela n’isiokwu a iji kwado ihe a na-ede banyere ya. E jiri atụtụ ọmụmụ ngosiputa ọrụ nke Emile Durkheim wee tụchaa nchọcha a ka e were gosipụta ọrụ emume ngabiga ụmụaka ndị na-arụ na ndụ ndị Igbo. Ka e mechara nchọcha a, a chọpụtara na ihe kpatara ndị Igbo ji eme emume ngabiga ụmụaka a bụ ka o nyere ha aka na ndụ ha ịbụ ‘mma ndụ’ zuru oke dị mma ibinyere ndị ọzọ n’obodo. Nchọcha a na-atụ aro ka ndị Igbo na-emepụta ejije nakwa ka ndị na-akụ egwu na-ewebata emume ndị a n’ihe ha na-eme, nke a ga-enye aka ime ka ụmụafọ Igbo na-amata maka omenaala ha. Na nchịkọta, ọ dị mkpa ka ụmụafọ Igbo niile nabata ma lọghachi azụ n’ime omenaala ha ọkachasị ndị dị mma dị ka emume a, n’ihi na onye omenaala ya furu, onye ahụ efuola kpam kpam.Downloads
Published
2024-07-07