This is an outdated version published on 2026-08-04. Read the most recent version.
ỊKỤZI MMỤỌ IGBA MBỌ N’IME NDỊ NTOROBỊA IGBO: IBUFE NKWENYE OMENAALA NA AKA AJA AJA NA-EBUTE ỌNỤ MMANỤ MMANỤ N’IME ỤMỤAKWỤKWỌ N’OGO SEKỌNDỊRỊ NTA
Keywords:
spirit of hard work, cultural beliefs, aka aja aja, ọnụ mmanụ mmanụ, Igbo youths, secondary school, education.Abstract
Ụmị Nchọcha a nyochara ikụzi mmụọ ịrụsị ọrụ ike n'ime ndị ntorobịa Igbo site n'ịbufe nkwenye omenaala aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ, n'ihi na mmụọ a na-ada ada n'etiti ndị ntorobịa taa; nke a kpaliri mụọ ndị nchọcha ime nchọcha a. Ebumnobi bụ ilekwasị anya na omenaala Igbo, agụmakwụkwọ, akụkọ ifo, ilu, akpalaokwu, abụ, na ọrụ aka dị ka ụzọ ime ka mmụọ ịrụsị ọrụ ike too n'ime ụmụ ntorobịa agba ọhụrụ. Usoro kwọlitativu na kọnsepụchual ka a gbasoro mee nchọcha a, nke pụtara na e ji nkọwa okwu (ọ bụghị ọnụọgụgụ) tụle akwụkwọ e dere ede, nchịkọta omenaala, na ihe atụ si n'ime obodo kọwaa nkwenye omenaala na agwa ndị na-eto eto. Dịka ihe atụ, akpalaokwu dị ka "onye rụsiri ọrụ ike anaghị anwụ n'ụkọ," abụ ndị a na-abụ n'oge ọrụ ubi, akụkọ ifo gbasara ndị dara ogbenye n'ihi ịrụsị ọrụ ike, na ilu dị ka "aka dị nro adịghị eri nri," gosipụtara omume ịrụsị ọrụ ike. Nchọpụta gosiri na iji nkuzi, mkparịtaụka, ọrụ aka, egwu na akụkọ ifo ga-eme ka mmụọ ịgba mbọ na-etowanye n'ime ndị ntorobịa n'ụzọ ga-akwalite mmụọ ndidi na mgbalị n'ime onwe ha. Ndị nchọcha kọwara na usoro tịọrị Culturally Relevant Pedagogy (nkuzi dabere n'omenaala ndị mmadụ) na Cultural Transmission (nnyefe omenaala) bara uru n'ịkụzi mmụọ ịrụsị ọrụ ike na nnyefe nkwenye omenaala. Nchọpụta a kwadoro ka ụlọ akwụkwọ, ndị nkuzi, na ndị okenye jikọọ aka inye ụmụ ntorobịa mmụta bara uru, kpalie ha ikike ịgba mbọ n'onwe ha bụ ihe e ji mara nwa amaala Igbo n'ụwa bido n'oge mgbe ochie. Keywords: ịrụsị ọrụ ike, omenaala, aka aja aja, ọnụ mmanụ mmanụ, ụmụ ntorobịa Igbo, sekọndịrị. Abstract Teaching the Spirit of Hard Work to Igbo Youths: Transmitting the Cultural Belief of Aka Aja Aja Na-Ebute Ọnụ Mmanụ Mmanụ among Secondary School Students This study examined how the spirit of hard work can be taught to Igbo youths through the transmission of the cultural belief aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ, prompted by the observed decline of this spirit among youths today. It focuses on Igbo culture, education, folktales, proverbs, oral poetry, songs, and community work as avenues for cultivating hard work among secondary school students. The study adopts a qualitative and conceptual approach, analyzing literature, cultural archives, and community practices (rather than numerical data) to explain the influence of cultural beliefs on the moral and character education of youths. For example, expressions such as "a hardworking person never dies in want," farm-work songs, folktales about those who suffered for neglecting hard work, and proverbs such as "the lazy hand does not eat" illustrate the value placed on hard work. Findings indicate that incorporating teaching, discussion, community work, songs, and storytelling effectively instills the spirit of hard work in youths, fostering diligence, perseverance, and personal development. The study also highlights the relevance of Culturally Relevant Pedagogy and Cultural Transmission Theory in teaching hard work and transmitting cultural beliefs. The study recommends that schools, teachers, and community elders collaborate to provide youths with meaningful learning experiences and encourage practical engagement, in order to preserve Igbo cultural values in contemporary society.Downloads
Published
2026-08-04 — Updated on 2026-08-04
Versions
- 2026-08-04 (4)
- 2026-08-04 (3)
- 2026-08-04 (2)
Issue
Section
Articles