ASỤSỤ EPUM IGBO: IHE NKETA NA OKE NDỊ IGBO

Authors

  • Cecilia Amaoge Eme Department of Linguistics Faculty of Arts Nnamdi Azikiwe University Awka, Anambra State, Nigeria
  • Joy N. Okeke Department of Linguistics/Igbo Faculty of Arts Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University Igbariam Campus, Anambra State, Nigeria

Abstract

Ụmịedemede Nchọcha a na-atụle asụsụ epum Igbo dịka ihe nketa na oke ndị Igbo. Ọ bụ iji gosịpụta mkpa ọ dị ka ndị Igbo hapụ ịgbakụta asụsụ Igbo azụ, kama ka ha kpọọ ya mkpa, na-echukwa ma na-akwalite ya n’ụzọ niile iji gbochiere asụsụ Igbo ọdachi ọnwụ. Ndị nchọcha mere nchọcha ha site n’ịkọwami ka ọnọdụ asụsụ Igbo dị n’ụlọ akwụkwọ praịmarị dị na Steeti Anambra nakwa ọrụ ndị ntorobịa Igbo n’iwulite Igbo. Ha sitere n’ịgba ajụjụọnụ na ihe ha hụtara ma gụtakwa nweta ngwa a tụlere maka nchọcha a. A gbara ndị isi ụlọ akwụkwọ iri abụọ na otu ajụjụọnụ iji mata ọnọdụ asụsụ Igbo n’ụlọ akwụkwọ ha, pụtara otu maka ụlọ akwụkwọ dị n’okpuru ọchịchị gọọmenti iri abụọ na otu e nwere na Steeti Anambra. E nwetakwara ọnụ mmiri ndị ntorobịa iri na ndị ọchịchị obodo iri iji mata echiche ha maka enyemaka ha n’ịkwalite asụsụ Igbo. A chọpụtara na Igbo nọ n’ajọ nsogbu nke ndị nne na nna ahafezighiri ụmụ ha asụsụ Igbo dịka asụsụ epum ha, bụ ajọ agwa ga-ebute ọnwụ ya bụ asụsụ ma ọ bụrụ na ndị Igbo emeghị ngwa ngwa meghara ya bụ ọdachi. A hụtara olileanya mwulite asụsụ Igbo na mbọ gọọmenti ịkwalite ọnọdụ Igbo n’ụlọ akwụkwọ, nakwa mbọ otu Igbo dị iche iche, ndị ọchịchị ndị obodo Igbo na ụka dị iche iche bụ nke mere ka ohere ịbụ asụsụ kwụ chịm dịkwara asụsụ Igbo. Ndị nchọcha wee na-akpọ ndị ntorobịa Igbo oku ka ha tinyewanye amamihe ha nwere na kọmputa na Atịfishal Intelịgens (AI) n’ọrụ iwulite ọnọdụ asụsụ Igbo.

Downloads

Published

2026-07-31