NKỤZI NA ỌMỤMỤ AGỤMAGỤ EDEREDE : DỊKA ỤZỌ E SI AKWALITE ASỤSỤ NA OMENAALA IGBO NKE `
Abstract
Ụmị Edemede Nchọcha a lebara anya n’Agụmagụ Ederede dịka Ụzọ E si Akwalite Asụsụ na Omenaala Igbo. Usoro a gbasoro mee nchọcha bụ usoro sọvee. Atụtụ nchọcha a bụ atụtụ nke Vygotsky wepụtara gbasara nkuzi na ọmụmụ. . Nsogbu asụsụ Igbo nwere taa sitere n’aka ndị Igbo n’onwe ha. Ndị nkuzi n’ụlọakwụkwọ bụ ndị so nwere asụsụ na omenaala Igbo gbahapụrụ asụsụ na omenaala Igbo, were asụsụ Bekee na-eme nkuzi na ọmụmụ. N’agbanyeghị na gọọmenti emeela ka ọ bụrụ iwu iji olu nne na-akuzi ihe n’ogo mmụta nke ọtakara, praịmarị na jụnịọ sekọndiri tupu asụsụ Bekee. Asụsụ na omenaala Igbo wee nọdụ ka ọbịa n’ala Igbo. Agụmagụ ga-enye asụsụ na omenaala Igbo nchekwa zuru oke ma ọ bụrụ na e were agụmagụ wee mụọ asụsụ na omenaala Igbo. E lebara anya n’ihe ndị a: nkọwa ihe bụ agụmagụ, asụsụ na omenaala, mmetuta dị n’etiti agụmagụ, asụsụ na omenaala Igbo, ihe butere enweghị mmasị ndị Igbo n’ebe asụsụ na omenaala Igbo dị, uru agụmagụ baara nkuzi na ọmụmụ asụsụ na omenaala Igbo, usoro e si eji agụmagụ kuzie ma mụọ asụsụ na omenaala Igbo n’ogo dị iche iche nke mmụta na ihe ọjọọ na-apụta n’ejighị asụsụ na omenaala Igbo akuziri ụmụakwụkwọ ihe n’ụlọakwụkwọ. E nyere ntuziaka na isite n’agụmagụ mụọ asụsụ na omenaala Igbo ga-atụlite mmasi ụmụakwụkwọ n’ebe asụsụ na omenaala Igbo dị. Ọ ga-emekwa ka asụsụ na omenaala Igbo gbanye ezi mgbọrọgwụ n’ala Igbo.Downloads
Published
2025-08-13
Issue
Section
Articles