ỌFỌ: NGWA IKPENKWỤMỌTỌ N’EJIJE IGBO

Authors

  • Ayozie, Chioma R. Directorate Of General Studies, Federal University Of Technology, Owerri

Abstract

Otu n’ime ihe kacha dị mkpa na ndụ ndị mmadụ bụ ikpenkwụmọtọ. Onye ọbụla n’ala Igbo chọrọ ka a na-enwe ikpenkwụmọtọ n’ihi na ọ ga-enye aka dozie ezinaụlọ, agbụrụ, obodo maọbụ mba. Ọtụtụ ihe ka e ji ekpe ikpenkwụmọtọ n’ala Igbo nke ọfọ so n’otu n’ime ya. Ọfọ bụ otu n’ime ngwa ofufe nke ndị Igbo na-akwanyere nnukwu ugwu n’ihi na ọ bụ ngwa ofufe nke e ji ekpe ikpe ziri ezi. Ọ bụ ngwa na-ekwu eziokwu, ngwa ikike nchịkwa nakwa ngwa e ji ahazi iwu n’ụzọ ziri ezi. Mana ọ dịghị etu ahụ n’oge ugbu a. A naghịzi eji ọfọ were ekpebi ikpe, ya mere ikpensọmanya ji were na-abawanye n’obodo. Mbunuche nchọcha a bụ ịchọpụta ọrụ dị iche iche ọfọ na-arụ, mkpa ọ dị iji ọfọ were ekpe ikpe ọbụla dapụtaranụ n’obodo nakwa ụzọ dị iche iche ndị odee ejije Igbo a họọrọ siri zipụta ụdị nsogbu e nwere nakwa ụzọ e siri were ọfọ were kpebie ha. Ihe e ji mee ntụcha bụ akwụkwọ ejije Igbo atọ ndị a họọrọ ndị bụ: O ji ihe Nwata nke Okoro na Epuchie dere, Obidiya nke Akọma dere na Akụ Fechaa nke Chukuezi dere. Nchọcha a bụ nke nkọwa. Site na nchọcha e mere, a chọpụtara na ọfọ na-arụ ọrụ ikpenkwụmọtọ n’etiti ọrụ ndị ọzọ. Nkabi ikpe ọbụla e jiri ọfọ kpee bụ o kwuchaa ọ gwụ. Ọfọ ka a na-ahụ dịka ihe bụ eziokwu n’ihi ikpe ziri ezi bi n’ime eziokwu. N’ụzọ dị mkpa, a na-atụ anya na nchọcha a ga-akpali mmụọ ndị Igbo ịmata uru na ọrụ ọfọ na-arụ. Ọ ga-emekwa ka ọtụtụ ndị Igbo na-agba mbọ maka ikpe ikpe ziri ezi. Ọzọkwa, a na-atụ anya ka e weghachita ọfọ dịka ngwa a ga na-eji akwado, achịkwa, ahazi ma na-ekpe ikpe ziri ezi n’ala Igbo.

Downloads

Published

2025-08-10