ERIMERI NDỊ IGBO N'OGE GBOO NA OGE UGBU A: MMETỤTA YA N’ASỤSỤ, AHỤIKE NA OBIBI NDU HA
Abstract
Ụmịedemede Omenala ndị bụ etu ndị ahụ si ebi ndụ ha. Erimeri Igbo sokwa n'omenala e ji maara ndị Igbo mana ọ bụ ihe gbara anya mmiri na ọtụtụ ndị Igbo nọ n'ọgbara ọhụrụ a amaghị ihe gbasara erimeri ndị nnanna ha n'oge gboo. Ọtụtụ n'ime ha, ọkachasị ndị a mụrụ na mba ofesi amaghị etu e si esi nri ahụ, naanị ihe ha maara bụ nri ọgbara ọhụrụ a nke ụfọdụ n'ime ha adịghị mma n'ahụ ndị na-eri ya. Nke a mere na ọtụtụ ndị ntorobịa anaghị ebite ndụ aka dị ka etu nnanna ha siri bi n'oge ochie. Ọ bụ nsogbu a kpalitere mmụọ nwanchọcha ime nchọcha a nke isiokwu ya bụ "Erimeri ndị Igbo n'Oge Gboo na Oge Ugbu a: Mmetụta ya n’Ahụike na Obibi Ndụ ha". Ọtụtụ ihe ka ndị Igbo ọgbara ọhụrụ amaghị gbasara nri nnanna ha riri n'oge gboo. Ebumnobi nchọcha bụ ịchọpụta nri ndị nnanna riri n'oge gboo na ịmata nri ndị ntorobịa na-eri n'oge ugbu a. Ọzọ, ka a mata etu erimeri ndị Igbo n’oge gboo na oge ugbu a sị metụta ọnọdụ ahụike na obibi ndụ ha, Usoro nchọcha a gbasoro bụ nke sọvee. Atụtụ e jiri mee nchọcha a bụ atụtụ mmekọrịta keerimeri (Theory of sociology of nutrition) nke Jean Anthelme Brillat-Savarian (1755-1826). Atụtu a na-enyocha ọdịdị na adịm mma erimeri, etu ndị si eri nri ha nakwa etu nri ndị a si emetụ ahụike mmadụ. Nwanchocha chọpụtara na ụfọdụ ndị ntorobịa a mụrụ n’oge ugbu a amaghị nri ụfọdụ ndị nnanna riri n’oge gboo dị ka ọna, anyụ, ero. Ha amaghịkwa etu e si esi nri ndị a nke ha ji ama ihe nri ndị a na-enye n'ahụ. Nchọcha a ga-abara onye ọ bụla uru n'ịhụ mkpa erimeri e ji maara ndị Igbo bụkwazi otu n'ime omenala Igbo dị. Ọ ga-abakwara ndị Igbo ọ bụla ọ kachasị ndị ntorobịa chọrọ ịma ihe niile gbasara erimeri ndị Igbo n'oge gboo na n'oge ugbu a uru. Ọ ga-enye aka ka nri ndị Igbo ghara ịla. Nwa nchọcha na-atụ aro ka onye ọbụla tinye aka n’ịgba mbọ hụ na ndị Igbo laghachiri n’erimeri e ji mara ha n’oge gboo maka ahụike ndị Igbo niile.Downloads
Published
2025-04-19 — Updated on 2025-05-04
Versions
- 2025-05-04 (3)
- 2025-04-19 (2)
Issue
Section
Articles