MKPA Ọ DỊ IJI NKANAỤZỤ ỌGBARA ỌHỤRỤ AMỤ NA ỊKỤZI ASỤSỤ IGBO

Authors

  • Akidi, Felista Chidi FEDERAL UNIVERSITY OF TECHNOLOGY, OWERRI
  • Ayozie Chioma RoseMary FEDERAL UNIVERSITY OF TECHNOLOGY, OWERRI

Abstract

Ụmịedemede Nkanaụzụ ọgbara ọhụrụ bụ nkanaụzụ ndị na-apụta n’ụwa site n’oge rue n’oge. N’oge ọbụla a na-enwe nkanaụzụ gbagolitere a na-etinye n’ọrụ iji azụ ahịa, agụ akwụkwọ, ezi ozi, etinye na adọrọ ego. ọkụ latirik, ngịga ụwa, igwe ome-nta-eme-imo, ọnya nwudide na ụlọọrụ nzirịta ozi MTN, AIRTEL, GLO na ndị ọzọ na-eme ka nkanaụzụ ọgbara ọhụrụ rụọ ọrụ nke ọma. Ihe kpalitere nchọcha a bụ na ka ọ dị ugbu a, ụwa na-emepe na-aga. Nkanaụzụ ọgbara ọhụrụ ka e ji emezi ihe niile dịka azụmahịa, itinye na ịdọrọ ego, njem, ọrụ ubi, agụmakwụkwọ, nzukọ na ọtụtụ ihe dị iche iche. Ebe ọ bụ na e jila nkanaụzụ ọgbara ọhụrụ na-eme ọtụtụ ihe dị iche n’ụwa taa; ọ kacha agụmakwụkwọ, ọ dị mkpa na e tinyere n’ọrụ iji nkanaụzụ ọgbara ọhụrụ na-amụ ma na-akụzikwa asụsụ Igbo. Edemede a kọwara mkpa ọ dị iji nkanaụzụ ọgbara ọhụrụ akụzi na ịmụ asụsụ Igbo. E ji nleru anya na ọmụmụ asụsụ ihe ndị a hụtara na ihe ndị a gụtara n’akwụkwọ wee kọwaa maka nkanaụzụ ọgbara ọhụrụ na ịkụzi na ịmụ asụsụ Igbo, uru nkanaụzụ ọgbara ọhụrụ ga-abara asụsụ Igbo, akamgba chere ya na ihe a ga-eme. A dụrụ ọdụ ka e weta nkanaụzụ ọgbara ọhụrụ n’ịkụzi na ịmụ asụsụ Igbo ka e wee nwee ike rite uru si na ya n’uju.

Downloads

Published

2025-04-02