USORO IGBO SI EGOSI ỤBARA
Abstract
Ụmị edemede Ụbara bụ okwu e ji egosi na ihe a na-ekwu karịrị otu. Asụsụ niile dị n’ụwa a nwere usoro ha si egosi ụbara ha. Asụsụ Igbo dịka asụsụ ndị ọzọ nwere ụzọ e si egosipụta ụbara nke ya. Nchọcha a lebara anya n’ụzọ dị iche iche e si egosi ụbara n’asụsụ Igbo. Ngụ na-ekwu maka ole ihe dị n’asụsụ Igbo. Ụfọdụ ndị na-eche n’Igbo nwere ngụ dịka katigori keaha. Nke a na-ebute ọtụtụ nsogbu na ihe mgbagwoju anya n’ebe ndị na-amụ na ndị na-akụzi asụsụ Igbo nọ. Nke a bụ ihe kpalitere ime nchọcha n’isiokwu a. Mbunuuche nchọcha a bụ ịkọwa ihe bụ ngụ, ịchọpụta usoro dị iche iche Igbo si egosi ụbara. Usoro a gbasoro mee nchọcha a bụ nke nkọwa. Atụtụ e ji mee nchọcha a bụ nke ndoko nkebiokwu. Nchọcha a gbadoro ụkwụ naanị n’asụsụ Igbo na igosi ụzọ o si egosi ụbara. Nwanchọcha gụrụ ọtụtụ akwụkwọ dị iche iche metụtara isiokwu a. A chọpụtara na Igbo enweghị ngụ dịka katigori keaha. Ya bụ na asụsụ Igbo anaghị egosipụta ụbara keaha site na mfekshọn nke aha.Downloads
Published
2025-04-02
Issue
Section
Articles