ǸGÀNÙSÒRÒ ǸSÌNỌNỌ̀DỤ̀ OKWŪ
Abstract
Ụmị Ederede Asụsụ ọbụla nwere usoro mkpụrụokwu ndị mebere ya si agakọrịta. Asụsụ Igbo nwere iwu na-achịkwa ngakọrịta mkpụrụụda na ibe ya, ngakọrita mkpụrụokwu na ibe ya, ngakọrịta usorookwu na ibe ya, d.g. Ọ bụ iwu ndị ahụ na-achịkwa ngakọrịta mkpụrụokwu mkpọaha abụọ ndị bụ ogbo ka e nyochara n’ederede a kpọmkwem. Nsogbu kpaliri nchọcha a bụ na n’oge agbaraọhụrụ a, ụfọdụ ụmụamaala Igbo anaghị aghọta ihe kpatara okwu ogbo ndị e nyochara n’ederede a ji agakọrịta ọnụ. Ọ dị mkpa na e mere ka ha mata ihe omimi ndị a ka ha wee si na ya matakwuo ihe banyere omenala Igbo. Mbunuche izugbe nchọcha a bụ ịhazi okwu ndị a bụ ogbo etu ha kwesịrị isi gakọ dị ka o si metụta Igbo Izugbe. A kọwara ihe bụ nganusoro na njirimara ya. E zipụtakwara etu nganusoro si apụta ihe n’asụsụ Igbo. A chọpụtara n’ikpe azụ na ọ bụrụ na a tụsaa okwu ogbo ndị kwesịrị ịgakọ ọnụ, ebumnobi ha ji agakọ agaghị apụtazi ihe. A na-atụ aro na ndị ga-eme nchọcha na nganusoro n’ọdịnihu ga-emetụ aka na nganusoro metụtara mkpọaha, ngwaa na mmeju Abstract The word order of every language is predicated upon its concord. The Igbo language concord covers a wide range of its phonem, word, structure, etc. This piece reviews the rules guiding the structure of twin words in theIgbo language. The problem that prompted this research is that in this modern times, many Igbo language users find it difficult to understand the reasons why some twin words in Igbo are being paired. This reseached paper considers it necessary to brings these secrets to limelight in order that these users of Igbo may be acquainted more with the Igbo language culture too. The general objective of this research is to structure these twin words in the order of their formation in line with the standard Igbo stipulations. The word used for the review that is supposed to be synonymous with‘theory’ is actually an antonym. Concord and its aptitudes are well elucidated. It was found out that if these twin words are separated, the aim of pairing them is defeated. It is recommended that future researchers extend their study of concord to nominal, verbal and complimentDownloads
Published
2025-04-02
Issue
Section
Articles