Ngaramara na Nchegharị dịka Ndịniisiokwu n’Ejije ndị A Họọrọ: Nzipụta na Ihe Mmụta
Keywords:
Agụmagụ, ejije, atụtụ nhụrụnanya, ngaramara, nchegharị, ndịniisiokwuAbstract
Agụmagụ bụ enyo e ji ahụ ndụ. Ọna-agba ebimndụ mmadụ ma nke ọma ma nke ọjọọ n’anwụ. Odee agụmagụ na-agbali izipụtara ọhanaeze ihe na-eme n’ụwa a nọ n’ime ya ọkachasi ihe gbasara omume dị iche iche mmadụ na-ezipụta.Ọ na-eme nke a site na ndịniisiokwu dị iche iche gbara elu n’agụmagụ o dere. E nwebeghị nchọcha e merela n’oge gara aga banyere isiokwu nchọcha a e ji akwụkwọ ejije ndị a họọrọ maka nchọcha a wee mee. Ebumnobi nchọcha a bụ ịjị akwụkwọ ejije anọ ndị a họọrọ gosi etu odee ha siri zipụta ndịniisiokwu ngaramara na nchegharị. Ọzọ bụịmata etu odee ejije ndị a siri zipụta agwa ndị hụtara onwe ha n’ọnọdụ ngaramara na nchegharị. Ọ ga-elebakwa anyan’ihe mmụta ọhaneze ga-esi n’ọnọdụ dị etu a wee mụta. Akwụkwọ ejije ndịa họọrọ bụChịadịkobi, Onye Loro Mkpụrụ Ụdara,Nwaanyị Bụ Ihe Ukwu naNke m Ji Ka. Nchọcha nkọwa a bụ nke a gbasoro atụtụ nhụrụnanya mee. Atụtụ nhụrụnanya a ka a kpọrọ empiricism theoryn’asụsụ Bekee. Ọ bụ atụtụ John Locke, nke na-akọwa na amamihe, sitere n’ihe mere mmadụ nke kuziiri ya ihe maọbụ ihe mmadụ hụlara na ndụ. A chọpụtara site n’akwụkwọ ejije ndị a,na odee ndị a zipụtara ngaramara dịka ọnọdụ na- ewetara mmadụ nchegharị. Ọzọ bụna odee ejije ndị a gosiri na ngaramara na-esi n’ihe adịghị mma nke mmadụ mere n’oge gara aga nke ọ chọghị ka onye ọzọ mee n’ihi na uru adịghị na ya. Ihe dị etu a ka mmadụ dị etu ahụ na-ezipụtara ọhaneze site na nchegharị ya ka ha kpachara anya ha. Nchọcha a ga-abara ma nwoke ma nwaanyị uru n’ihi na ha ga- amụta ọtụtụ ihe na-ebute ngaramara na ọnọdụ nchegharị ma gbaara ha ọsọ ka ihe mere agwa ndị nke a metụtara n’ejije ndị e jiri mee nchọcha a ghara ime ha.References
Anọzie, R.O, Anọzie, C.I na Anọzie, C.C. (2014). Agwa Ọjọọ, Ntaramaahụhụ na
Mgbaghara N’Iduuazị Isii. Enugwu: Computer Edge
Echeruo, M.J.C. (2001). Igbo-English Dictionary. Legọs: Longman
Ejiọfọ, P. (2016). Obibi Ndụ Ndị Igbo. Ọka: Valid Publishers
Ifeka, Ọ. (2016). Onye Loro Mkpụrụ Udara. Ọnịcha: Perfect Image Publishers
Mbah, B.M., Mbah, E.E., Ikeokwu, E.S., Okeke, C.O., Nweze, I.M., Ugwuona, C.N., Akaeze, C.M., Onu, J.O., Eze, E.A., Prezi, G.O., na Odii, B.C. (2013). Igbo Adị. Enugwu: University of Nigeria Press
Nwana, P. (1933). Omenụkọ. London: Longman
Nwaozuzu, G.I. (2005). Nke M Ji Ka. Enugwu: CIDJAP
Obidiebube, J.I. (2015). Nwaanyị Bụ Ihe Ukwu. Nkpọr: Galaxy Prints
Ọnwụ, A.J. (2006). Isiokwu na Akanka n’Iduuazị Igbo nke Ọfọmata. Projekti nke
MA, o deere Mahadum Naijirịa dị na Nsụkka
Ọnwụneme, D.G.C na Asika, I. (2013). Chiadịkaobi. Ọnịcha: First Class
Publishers
Ude, J.U. (2006). Ntụle Ugomma na Ọchọ Ihe Ukwu. Projekti, o dere na Federal
College of Education, Eha-Amufu, nke e bipụtabeghị ebipụta
Umo, U.C na Ezema, O.T. (2007). Mkpanaka Akwụkwọ Ọmụmụ Nchọcha n’Asụsụ
na Omenaala Igbo. Enugwu: Ifedimma Communications
Ụzọchukwu, S. (2007). Akanka na Nnyocha Agụmagụ Igbo. Legọs: Sam Orient
Publishers