AKPARAMAGWA AHA ỤFỌDỤ: NKỌWA MPỤTARA NA NZIPỤTA HA
Keywords:
Aha, Mputara na NziputaAbstract
Ụmịedemede: Nchọcha a bụ maka akparamagwa aha ụfọdụ mpụtara na nzipụta ha. Aha bụ ihe e ji mara mmadụ kpọmkwem nke na o nweghị onye ya na ya ga-azọ ya azọ. Ọ bụ aha e nyere ụfọdụ ihe na-enye aka zipụta akparamagwa, ụdịdị ihe e ji ha eme maọbụ uru ha baara nye ndị nwe ha. Ihe kpalitere mmụọ nwanchọcha bụ ime ka ndị mmadụ mata na ụfọdụ n’ime ihe ha nwegasịrị dị na gburu gburu tumadi ndị enweghi ndu e nwere n’ala Igbo nwere ike ịkpa agwa di ka aha ọ na-aza siri dị. Ọzọ, ụfọdụ nwere ike ikpa agwa site n’ụdịdị ya maọbụ uru ọ baara ndị nwe ya, ebe ụfọdụ na-apụta ihe site mpụtara ha na-ezipụta n’ụzọ dị iche iche. Ọzọ, ụfọdụ bụ aha nsinangwaa, ụfọdụ bụ nkebiokwu keaha, ụfọdụ bụ aha nsinahịrịokwu, ụfọdụ bụ aha nkọwa mebere ha, ụfọdụ bụ aha nkọwa, ụfọdụ bụ aha ucheụda maọbụ nsinụda mebere ha, dg. Nwanchọcha ahụbeghị onye merela nchọcha iji chọpụta akparamagwa aha ụfọdụ ma chọpụta mpụtara na nzipụta ha gasị n’otu ụzọ maọbụ n’ụzọ ọzọ. E jikwa atụtụ mmebe mkpụrụokwu nke Kiparsky na Mohanan (1982) tụpụtara rụọ ọrụ ebe ọ dị ukwu maka na ọtụtụ aha ihe ndị a bụ site na mkpụrụasụsụ mebere mkpụrụokwu ka e si mebagasịa aha ha. Ebe nwanchọcha siri weta ngwa nchọcha ya bụ n’akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche, ajụjụ ọnụ ọ gbara ndị gụrụ asụsụ Igbo nke ọma. Ihe nwanchọcha bu n’obi bụ ịchọpụtagasị akparamagwa aha ihe ndị ahu, ụdịdị ha, ihe e ji ha eme maobụkwanụ uru ha baara ndị nwe ya. Ebumnoobi nwanchọcha ọzọ bụ ime ka anya ụmụafọ Igbo meghee site n’ịmata na e nwere ike iji aha ihe ndị a chọpụta ọrụ ha na-aru kwa mgbe. Nwanchọcha chọpụtara na e nwere ike ịmata aha ihe ndị a site n’ụdịdị ha maọbụ nyochaa ya site na akparamagwa ha gasị. Ọ chọpụtara na aha ihe ụfọdụ n’ala Igbo gbasoro usoro atụtuụ njieme, atụtụ gburu gburuna mmebeokwu. Ọzọ, ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ nwetara aha ha site n’ọrụ ha n’arụ, ụfọdụ site n’ụdịdị aha ha na uru ha baara ndị nwe ya. Nwanchọcha chọpụtakwara na ụfọdụ aha ihe ndị a gbasokwara usoro ndokọokwu na usoro nghọtaokwu wee na-arụ ọrụ ya. N’ikpeazụ, nwanchọcha mejupụtara ebumnuuche ya site n’ime ka ụmụafọ Igbo mata na ihe ụfọdụ e nwere n’ala Igbo nwere ndị a choputara site akparamagwa, udịdị na uru ha baara ndị mmadụ na gburu gburu ebe ha dịgasị.References
Edensibịa
Abarrg, A. (1991). “The significance of names in Ghanaian drama” n’ime Journal of Black Studies. Vol. 22 No. 2 pg 157-167.
Agbedor, J. (2005).“The Similarities between naming practices among Ewe in Ghana and Guin-Mina in Togo”. E wetara na University of Ghana.http://ugspace;ug.edu.gh31language/linguistics On 27July,2016.
Agyekum (2006).“Anthropological and Philosophical notions of Akan.Personal names”. E wetara na University of Ghana http://ugspace;ug.edu.gh31 language/linguistics On 25 July, 2016.
Amamgbo, O. C. (2011). Ogechukwu ka mma. Onicha: Ben-Cons Publishers.
Bernhardt, S. (2001). African names, reclaim your heritage. South Africa: Struik Publisher.
Ekwealọ, C. C. (1996). Omenala na ewumewu ndị Igbo. Ọnịcha: Africana First.
Frege, G. (1952). “On sense and reference: Translations from philosophical writings of Gofflob Frege” Oụford: Blackwell.
Geertz, P. (2006). Person, time and conduct in Bali. An essay in cultural analysis.Program cultural report series. Yale: South East Asian Studies.
Hallowell, A. I. (2005). The self and its behavioural environment in culture and eụperience.Philadelphia: University of Pennsylvania Press.
Ilogu, E. (1974). Christianity and Igbo Culture. Ọnịcha: University Publishing Company.
Mbiti, J. S. (1977). African religion and philosophy. London: Edinal.
McGraw, H. (1993). The school dictionary 3.New York: Macmillan.
Nwigwe, B. (2001). “Naming and being philosophical investigation on names and objects with special reference to Igbo anthroponyms” Retrievedfromwww.naming.1phil212…//antro.com on 26 July, 2016..
Nzeako, J. U. T. (1979). Omenala ndị Igbo. Ibadan: Longman.
Obaji, C. N. (1982). Language: philosophical magazine. Ikot Ekpene: Bigard.Memory Seminary Press.
Okodo, A. I. (1988). “Title names of traditional rulers in Anambra State:A sociolinguistic analysis”. Unpublished B. A. Project, UNN..
Onumajuru, V. C. (2007). “ A semantic and pragmatic analysis of Igbo names”. Retrievedfrom www.Afrejo.net/journals/.../roll0no2art.cm On 26th July,2016.
Simon, S. (1975). Webster’s new encyclopedia dictionary: London: Sacramento..
Sutherland, E. T. (1991). Marriage of Anansewa. England: Longman.
Ubahakwe, E. (1981). Igbo names: Their structure and their meanings. Ibadan: Daystar Press.
Uchegbu (2010).“Infancy rites among the Igbo of Nigerian”. Research Journal Studies-Issue. Retrievedfromwww.researchjournal//aca.org/LI..%1’AS.On July,2016.
William, B. (2005). The new encyclopedia Britannica, Vol. 24 Marcropedia. U.S.A. Encyclopedia Britannica Inc.
Zawawi, S. M. (1998). African muslim names: Images and identities. Trenton: African World Press.