ỊNYA ỌKỤ NWA N’ISIAMAIGBO AGỤLỤ: NZIPỤTA ỌṅỤ NWA
Abstract
Ụmịedemede: Ndị Igbo ghọtara na nwa bụ onyinye nke Chineke ji agọzi mmadụ. Ha kwenyekwara na agamnihu ezinaụlọ ọ bụla na-esite n’ọmụmụ. N’ihi nke a, oge ọ bụla a mụrụ nwa n’ezinaụlọ onye Igbo, ọ na-abụ ihe nnukwu aṅụrị. Ọ bụ aṅụrị a ka ndịIsiamaigbo Agụlụ na-ezipụta site na mmemme ịnya ọkụ nwa. Ịnya ọkụ nwa bụ mmemme nke ezinaụlọ mụrụ nwa ọhụrụ na-akpọkọ ụmụaka nwaanyị niile nọ n’ụmụnna ha, ka ha bịa soro ha ṅụrịa n’ihi nwa ọhụrụ ha mụtara.Ma ọ dị mwute na anghịzi eme ọmarịcha omenala a. Nke a emeela na ọtụtụ ụmụnwaanyị aghọtachaghịzi uru nwa bara na ọrụ hanwere n’ịzụlite nwa. Ọ na-emekwa ka ụfọdụ ndị mmadụ n’oge a na-emeso ụmụaka ọtụtụ ajọ omume dị iche iche. Ebumnobi nchọcha a bụ ịchọpụta ihe mere na anaghịkwa anya ọkụ nwa etu e si eme na mbụ. Ọzọ bụ ịgba n’anwụ etu ndị na-eme mmemme ịnya ọkụ nwa si eji ya egosi ọṅụ nwa tinyere ime ka ụmụaka ndị nwaanyị mata na ha nwere oke na ọrụ ha ketara n’ilekọta nwa. Nchọcha a bụ nke sọvee, a chịkọbara ya n’Isiamaigbo Agụlụ. Ndị njiri mee nchọcha a bụ ndị okenye na ụmụagbọghọmere mmemme a oge a ka na-eme ya. Nwanchọcha gbara ndị a ajụjụ ọnụ ma tụlegharịa ihe ndị odee ọzọ derela n’isiokwu yitere nke a. E ji atụtụ Ịntarakshọnism were zipụta na ịnya ọkụ nwa dị omimi n’ihi na ọ bụghị naanị na ọ na-ezipụta ọṅụ nwa kama na nwaanyị na nwa adịghị nkewa. Nchọpụta gosiri na anaghịzi eme mmemme ịnya ọkụ nwa nke ihe ndị kpatara ya gụnyere: mgbanwe n’usoro obibi ndụ ndị Igbo, ihe isiike, anyaụfụ, mmepe, na ndị ọzọ. A tụrụ anya na nchọcha a ga-eme ka ndị Igbo leghachi anya n’omenala ha ndị dị mma ghara iji ọsọ na-agbakwuru naanị omenala ndị mba ọzọ. Nke a ga-eme ka ezi echiche na akparamaagwa e ji mara Igbo ndị na-efunarị ha dịwakwa ire.References
Akpulu, E. O. (2020). “Ịkpọlite Ezi Akparamagwa na Usoro Obibi Ndụ Ndị Igbo.” N’ Odezuruigbo: Jọnal Ozuru Ụwa nke Amụmamụ Igbo, Afịrịka na Eshia, 4(1) ihu 81-92.
Aksan, N., Kisac, B., Aydin, M. & Demirbuken, S. (2009). “Symbolic Interactionism Theory.” www.sciencedirect.com. E wetere na 27/01/2023.
Ani, N. & Anachunam, C.C. (2021). “Nzipụta Ọnọdụ Ụmụnwaanyị n’Akwụkwọ Ndị A Họọrọ: Ihe Ịdọ Aka Na Ntị Nye Ụmụ Igbo.” N’Enyo: Jọnal Ndị Ji Edemede Akwalite Asụsụ na Omenala Igbo, 2(1) ihu 56-67.
Ekwealor, C. C. (1998). Omenala na Ewumewu Igbo. Onitsha: Africana First Publishers.
Haralambos, M. & Heald, R. (1980). Sociology: Themes and Perspectives. United Kingdom: University Tutorial Press.
Metuh, E. I. (1981). God and Man in African Religion: A Case Study of the Igbo of Nigeria. London: Geoffery Chapman.
Obi, D. O. & Chris, U. M. (2019). “Childlessness in Marriage: A Review of Challanges it Poses to Contemporary Igbo Families in Nigeria.” N’International Journal of Current Research, ihu 8867-8875. http://www.journalcra.com. E wetere na 6/05/2021.
Obinna, A. A. (2015). Nchịkọta Nkuzi Odenigbo: Nchịburu 1996-2000. Owerri: Assumpta Press.
Ofomata, C.E. (2012). Omenaala na Ọdịnaala Ndị Igbo. Enugu: Format Publishers.
Okafor, C. N. (2020). “The Nwa Ọha Value System in Igbo: Exploring the Significance of Community Parenting in the Selected Text.”N’Odezuruigbo: Jọnal Ozuru Ụwa nke Amụmamụ Igbo, Afịrịka na Eshia, 4 (1) ihu 168- 183.
Onwuatuegwu, I. N. (2010). The Concept of Reincarnation in Igbo Ontology: A Philosophical Appraisal. Nimo: Reo Charles & Patrick.
Sandrock, J. W. (2006). Life-Span Development Psychology. New York: McGrow Hill Companies.
Udemmadu, T. N. (2021). “Ịzụlite Ụmụaka.” Na Nnyigide, M. N., Isidienu, I. C., na Udechukwu, G. I. Ọmụmụ Agụmagụ na Omenaala Igbo.Awka: Fab Anieh.
Downloads
Published
Versions
- 2023-12-31 (2)
- 2023-12-31 (1)