NTỤLE ỌDỊMARA AHỤMỌNỤ NWANYỊ N’ỌZỤBỤLỤ NA ABATETE N’USORO NCHEKE
Abstract
Ụmịedemede Nchọcha a bụ nke ga-atụle ọdịmara ahụmọnụ nwanyị n’obodo Ọzụbụlụ na Abatete n’usoro ncheke. Ebumnobi nchọcha a bụ ịchọpụta ihe ndị Ọzụbụlụ na Abatete kpọrọ ịhụọnụ nwanyị ha, ịchọpụta ọdịmara pụtagasịrị ihe n’ịhụọnụ nwanyị n’obodo Ọzụbụlụ na Abatete, ịchọpụta mmado dị iche iche na mpụtara dị n’ahụmọnụ nwanyị n’obodo abụọ a, ịchọpụta myiri na ndịiche dị n’ịhụọnụ nwanyị n’Ọzụbụlụ na Abatete, ịchọpụta ma e nweela ihe mgbanwe dị n’ahụmọnụ nwanyị n’obodo abụọ a. Usoro nchọcha a ga-agbaso bụ nke nkọwasị na sọvee. Atụtụ ga-agbazi ụzọ ntụle nchọcha a bụ atụtụ njirime na atụtụ ndịna ncheke. Nchọpụta na-egosi na aha Ọzụbụlụ na-akpọ ahụmọnụ nwanyị bụ ime akụ, ebe Abatete na-akpọ ya ịka akịlịka. Ọdịmara pụtagasịrị ihe banyere ihe ha jigasị ahụọnụ nwanyị bụ: Ọzụbụlụ ji mkpirisi aziza, maọbụ ogirisi, ego ayọrọ wdg, Abatete ji akịlịka igu nkwụ maọbụ nke ngwọ, akpụrụ ewu, wdg. Ihe ndị a na-ekpuchi bụ ego; ọgụ ego, nnụ ego, akpa ego, ego mmege, wdg. A chọpụakwara na obodo abụọ a anaghị amado otu ihe n’elu ihe ndị ahụ ha ji ahụọnụ nwanyị ha. Ịmaatụ, n’ọdịnala Ọzụbụlụ, e ji ọgbụehi amado n’elu ehi ọgọ ha ga-akpụta ma ọgọ ya nwoke maọbụ nke nwanyị nwụọ. N’Abatete, e ji mkpọ ntụ abụọ amado n’ehi ọgọ ga-akpụta mgbe ọgọ ya abụọ nwụrụ. Na mmechi, ọ dịmkpa ka ndị ọkammụta, ndị nchọcha, ndị nkuzi na ụmụ akwụkwọ ga-agbalị mee nchọcha n’ụdị isiokwu a maọbụ nke yiri ya n’asụsụ mba ọzọ na steeti ndị ọzọ, ka ndị na-etolite etolite wee nwee ebe mgbakwasa ụkwụ. Ọzọkwasị, nhazị na nkuzi ọdịnala Igbo dị oke mkpa n’ihi ya o kwesịrị ka obodo ọbula nwee ndị maara ọdịnala obodo ha nke ọma maka ịza na ịkọwa maka ọdịnala ha mgbe ọbụla achọrọ.References
Edensibịa
Anozie, C.C. (2003). Igbokwenu (Akụkọ na Omenala Ndị Igbo). Enugu: Computer Edge Publishers.
Cohen, A. (1974). Urban Ethnically. London: Tariskock Publication.
Deignam, A. (2003). Metaphorical expression and culture: An indirect link, Journal of Metaphor and Symbols, vol. 18.
Ekwealor, C.C. (1999). Omenala na Ewumewu ndị Igbo. Onitsha: Paline Publishing and Links.
Emenanjọ, E.N. (1978). Essentials of Modern Igbo Grammar: A Descriptive Approach. Ibadan: Oxford University Press.
Emenanjọ, E.N. (2000). Fọnọlọji na Mọfọloji n’Igbo Izugbe. Onitsha: Vasity Publishing Company.
Firth, R.W. (1974). The Urbanization of Sophia. New York: Martin Associates.
Hofstede, G. (1997). Culture and Organizations: Software of the Mind. New York: McGraw Hill Publishers.
Lacoff, G. & Johnson, M. (1980). Metaphors We Live by. Chicago: University of Chicago Press.
Matthews, P. (2007). The Concise Oxford Dictionary of Linguistics. Cambridge: Cambridge University Press.
Mbah, B.M. & Mbah, E.E. (2014). Atụtụ Amụmamụ Asụsụ. Nsụka: University of Nigeria Press.
Ngoesi, M.C. (2004). Nchịkọta Ihe Ọmụmụ nke Asụsụ Igbo maka Ule Sinịọ Sekọndịrị: Nkpọ: Optimal Press.
Ofomata, C.E. (2013). Ndezu Ụtọ-Asụsụ Igbo. Lagos: Longman Nigeria Plc.
Okebalamma, C.N. (2003). Mkpọlite Agụmagụ Ọnụ Igbo. Enugu: Snaap Press.
Osuagwu, B.I.N. (2004). Ndị Igbo na Omenala ha. Lagos: Macmillan Publisher.
Wittgenstein, L. (1953). Philosophical Investigation. Oxford: Blackwell.
Downloads
Published
Versions
- 2023-12-31 (2)
- 2023-12-31 (1)