Nzipụta Ndụ Ọchọnike n’Ime Ụmụagbọghọ n’Iduuazị Ijeọma na Ije na Isi Akwụ Dara n’Ala

Authors

  • Anagor, Chioma Chiazom Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka Na Nzikọrịtaozi Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka
  •  Nkechinyere Anthonia Nwokoye Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka Na Nzikọrịtaozi Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka

Abstract

Ụmịedemede: N’oge gboo, ndị Igbo nwere omenala ha na-emere nwaanyị ọbụla topụtara ogo ịlụ di nke ha kpọrọ ipụ ebe maọbụ iru mgbede. Ha na-eme nke a iji kwadoo ha maka ịbanye be nwoke. Nwaagbọghọ ọbụla na-akwanyere onwe ya ugwu ka o wee lụta di dị mma ma si be nna ya pụọ. Ọ bụ arụ na nwaagbọghọ gbasoro nwoke emeghị ego n’isi ya fọzịa isi n’ụzọ abụla ụzọ naghara onye ọzọ di ya. Ọ bụghị oke na ọrụ nwaanyị ịchụ nwoke kama ọ bụ nwoke ka ọ dịịrị ịchụso nwaanyị ọbụla o nwere mmasi na ya ma hụ na o nwere ihu ọma ebe nwaagbọghọ ahụ nọ iji mee ya nwunye ya mana n’oge ugbua, ihe na-adachigha azụ. Ụfọdụ ụmụagbọghọ chọziri isi n’ụzọ abụla ụzọ lụta di. Ha na-eme ihe megidere omenala na nkwenye ndị Igbo dị ka nwaanyị inaghara enyi ya nwaanyị di ya maọbụ were ahụ ya na-atụ mgbere. Agwa dị etu a na-ezipụta ndụ ọchọnike n’ime mmadụ. Ọ bụ ihe ndị a kpaliri mmụọ odee ime nchọcha n’agụmagụ ndị Igbo; Ijeọma Na Ije na Isi Akwụ Dara n’Ala ma zipụta ọchọnike pụtara ihe n’ime ụmụagbọghọ na nsogbu o na-ebute. Dị ka a maara, ọchọnike bụ mmadụ ịchọ ihe n’ụzọ abụla ụzọ n’agbanyeghị ihe ọ ga-apụta n’ikpeazụ. Ndị nchọcha gbasoro usoro nkọwa wee zipụta ihe ndị a chọpụtara ma gbado ụkwụ n’atụtụ saikoanalisis nke Sigmund Freud tụpụtara n’afọ 1856-1939 wee tụchaa akwụkwọ ndị a. Atụtụ a dabara karịa ndị ọzọ n’ihi na ọ na-eleba anya n’ọnọdụ ime mmụọ mmadụ nke na-apụta ihe n’agwa ya. A chọpụtara na ọchọnike bụ enweghị ndidi, enweghị afọ ojuju na anyaukwu na-eduba ọtụtụ n’agwa a. A hụkwara na ihe niile ahụ mmadụ na-adọgburu onwe ya n’ọrụ ka onweta n’ụzọ abụla ụzọ ga-emechaa tinye onye ahụ na nnukwu nsogbu nke nwere ike wepụ ndụ ya maọbụ ndụ ndị ọ hụrụ n’anya ma a kpachaghị anya. Nchọcha a ga-abara onye ọbụla uru iji mee ka a mata mkpa ọ dị mmadụ ịdị na-echemi echiche ime tupu o nwee mkpebi ọbụla na ndụ ya ma matakwa na ọchọnike na-ala n’ike,

Author Biographies

Anagor, Chioma Chiazom , Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka Na Nzikọrịtaozi Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka

              

 

 Nkechinyere Anthonia Nwokoye, Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka Na Nzikọrịtaozi Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka

 

 

References

Edensibịa

Abdulkareem, A.A. (Febụwarị 28, 2022). “Desperation to Make Quick Money: A Complication That Leaves Our Country in Danger”. Weghachitere site na http://www.thecable.ng na Disemba 24, 2022

Ackerman, C.E. (Mee 7, 2018). “Psychoanalysis: A History of Freud’s Psychoanalytic Theory”. Weghachitere site na https://positivepsychology.com na Febụwarị 27, 2023

Amamgbo, O.C. (2021). Ijeọma na Ije. Onitsha: Ben-Cons Publishers

Amie, F. (Nọvemba 14, 2018). “Desperation-Causes, Consequences and How To Avoid

It”. Weghachitere site na http://www.nairaland.com na December 24, 2022

Ayodele, A. (Ọktoba 8, 2022). “Nigerians React as Lady Dies During Plastic Surgery”

in Daily Post. Weghachitere site na http://dailypost.ng na Disemba 24, 2022

David, C. (Febụwarị 25, 2019). “Desperation’s Effect on Decision Making”. Weghachitere site

na http://www.meduim.com na Disemba 23, 2022

Echebima, H.C. na Ikeokwu, E.S. (2017). “Characterization and Naming: A Relational

Identity in Eruru and Ọnọdụ Ugo” na Journal of Igbo Studies (IJS). Vol. 12(2): 28-53

Ejinkeonye, U. (2011). “Desperate Women and Their Obscene Fashion”. Weghachitere site na

http://www.saharareporters.com na Disemba 21. 2022

Enewaridideke, E. (Julaị 1, 2021). “No to Desperate Politicians” in Vanguard. Weghachitere site na http://www.vanguardngr.com na Disemba 25, 2022

Hannan, C.E. (2019). “Very Superstitious: The Relationship between Desperation and Superstitious Behaviour”. Murray State Thesis and Dissertation. Weghachitere site na

http://www.digitalcommons.murraystate.edu/etd/145 na Disemba 20, 2022

Ifejirika, E. (2014). Introduction to Literary Theory, Criticism and Practice. Ọka: Mabcom

Systems.

Quen, S. (Ọktoba 11, 2020). “Dangers of Desperation and How to Overcome”. Weghachitere site na http://www.sammyquen.com na Mee 8, 2023

Sabater, V. (November 15,2021). Desperation: When You Think All is Lost. Weghachitere site

na http://www.exploringyourmind.com na Disemba 23, 2022

Ubesie, T.U. (1973). Isi Akwụ Dara N’ala. Legọọs: Oxford University Press

Uwaoma, N. (1997). Introductory Psychology. Legọọs: Chinedum Publishers and Stores

Downloads

Published

2023-12-31