MGBANWE DỊ N’EMUME AKWAMOZU N’OGE UGBUA: OBODO ABAGANA DỊKA EBE NLERU ANYA

Authors

  • Chioma Faustina Nwankwu Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka na Nzikọrịta Ozi Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka, Steeti Anambra, Naịjirịa
  • Ikechukwu A. Okodo Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka na Nzikọrịta Ozi Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka, Steeti Anambra, Naịjirịa

Keywords:

omenala, akwamozu, mgbanwe

Abstract

Ụmịedemede: Omenala bụ otu ihe zuru ụwa niile ọnụ, nke dị ọkpụ dị ka ndụ n’onwe ya, bụrụkwa nke n’amaliteghị taa. Ọ nọ ọnọdụ dị ka mmiri na ọbara dị n’ime ahụ mmadụ nke bụ e wepụ, ọ bụrụ ọnwụ. Omenala ndị Igbo bụ nke na-egosi etu ha si ebi ndụ nke gụnyere ejiji ha, erimeri ha, echichi nakwazi ụzọ akwamozu ha dg. Ọ bụ ya mere ndị nchọcha jiri họrọ akwamozu dị ka isiokwu nchọcha a. Nchọcha a bụ maka mgbanwe dị n’emume akwamozu n’oge ugbua. Akwamozu bụ mmemme a na-emere onye nwụrụ anwụ ma okenye ma nwata. Ọ bụ ụzọ e si eketọpụ ndị nwụrụ anwụ n’ebe ndị dị ndụ nọ. Ọ bụkwazị ụzọ e si akwanyere onye nwụrụ anwụ ugwu. N’oge ugbua, akwamozu adịghịzị ka ọ dị na mbụ, ọtụtụ ndị mmadụ na-ahụ akwamozu dị ka ụzọ e ji akpa ego nakwazi oge oriri na ngwọrị. Ugbua, ọtụtụ ndị ọgbara ọhụrụ ewerela akwamozu dị ka oge e ji ama aka ịma isi ka isi na onye ka onye n’obodo, tinyekwara oge e ji ama ndị ka jide ego n’etiti ndị mmadu nwụnahụrụ nakwazị ndị nwunye a lụbatara n’ime ezinaụlo ahụ. Ebumnobi nchọcha a bụ ịchọpụta ụzọ dị iche iche e si emefu oke mmefu oge a na-eme akwamozu, ọkachasi site n’aka ndị ụka, ụmụnna, ndị nwunye a lụbatara, dg n’ihi na ọtụtụ ezinaụlọ na-enwe ndaghachi azụ ma ha kwachaa ozu. Ndị nchọcha gbakwasara ụkwụ n’atụtụ nkọmirikọ wee mee ntụcha nchọcha a. Nchọcha a gbasoro usoro nke sọvee site n’igba ọtụtụ ndị mmadụ ajụjụ ọnụ ọkachasị ndị okenye n’ụzọ pụrụ iche. Nchọcha a ga-enye aka nke ukwuu n’agụmagụ omenala Igbo. Nchọcha a ga-abara ma kuziere ndị na-etolite etolite usoro emume akwamozu n’oge ugbua, ma mekwa ka ha mata na o nweghị uru dị n’ịma aka ha na-eme oge a na- eme emume akwamozu. Ọ ga-emekwa ka ndị nchọcha na-abawanye n’amamihe gbasara ihe ha na ede maka ya. Aro nchọcha a bụ ka ndị obodo, ndị ụka, ụmụnna hụ akwamozu dị ka oge iru ụjụ na ọ bụghị oge oriri na ngwọrị. N‘aka nke ọzọ ka ndị ụka wetuo aka n’ego ha na-anata n’isi onye nwụrụ anwụ ma nri nke ha na-achọ na aka ndị na-eru ụjụ.

Author Biography

Ikechukwu A. Okodo, Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka na Nzikọrịta Ozi Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka, Steeti Anambra, Naịjirịa

 

 

 

 

 

 

 

References

Edensibịa

Agu, W (2002). Funeral rites in African Culture Vis-à-vis The Christian Funeral Nacaths J.A. Theology (12):9-16.

Amadi, E. (2005). Ethics in Nigeria culture. Ibadan. Heinemann.

Bali, D.R. (1997). Introduction to philosophy. New Delhi: Sterling Publishers.

Beller, R. (2001). Life, person and community in Africa. Way towards enculturation with spirituality of focalare. Nairobi: Paulines.

Ekwealor, C.C. (2010). Omenala na ewumewu Igbo. Onitsha: Africana First Publishers.

Eme, C.A. na Mmadike, B.I. (2017). Asụsụ na Omenala Igbo Dị ka ụdọ Idịkọ Nootu n’oge Globalaịzashọn. N’ime Ekwe Jọnal Vol. 4. No, 1.

Ezeuko, R.O. (2009). Ewumewu, omenala ofufe na nkwenye ndị Igbo. Onitsha: Elukokwa Publishers.

Gluckman, M. (1937). Mortuary Customs and death among the south Eastern Bantu.Bantu. The judicial Process among The Barotse, Bantu Studies, 11,2,36-117.

Radzilani, M.S. (2010). Discourse analysis on performance of bereavement ritual in a Tshivenda speaking community. An African Christian and traditional African perspectives. Unpublished Doctoral Thesis, University of pretorial. South Africa.

Ilo (2008). Industrial Enterprises. Issues in third world development crisis evidence from Nigeria.(pp. 264-284).

Jimoh, S.A. (1985). Nigeria concept of death and its implications for counselling in Nigeria. International Journal for the Advancement of Counselling.8, 75-85.

Lee. H.W. (2006). International human resource management can be achieved through cultural studies and relevant training. The Business Review, 5(2),95. retrieved from ProỌuest.

Lenkeit, R.E. (2001). Introducing cultural anthropology. Boston: McGraw-Hill.

Mooney, Knoụ, & Schacht. (1997). Understanding social problem. Minneapolis:

Mbiti, J.S. (1975). Introduction to African religion. London: Heinemann Education Books

Mkpa, M.A.(2001). Social and cultural systems in Nigeria. Inc. Ofuebe CED) Dynamics of Social Studies. (PP. 105-127) Enugu: New Generation.

Nwadike, I. U. (2009). Naijiria, asụsụ, omenala na mmepe obodo. N’ime Jọnal Mmụta Igbo.

Nwala, U. (1985). Igbo philosophy. Lagos: Literamed Publications.

Odumegwu, I.H.(2006). Health as a cultural phenomenon in philosophy. Science and society: Essence-interdisciplinary, International Journal of Concerned African Philosophers, 3,155-161.

Ogbalụ, F.C. (1987). Omenala maka junior sekọndịrị n’usoro nke 6-3-3-4. Ọnịcha: University Publishing.

Ogbukagu, I.N.T.(2008). Traditional Igbo beliefs and practices. Enugu: Novelty Industrial Enterprises.

Okaba, B. (1999). Change and continuities in funeral celebrations: Evidence from

Okoye, B.D. (2015). Mgbanwe batara n’omenala ndị Igbo. Igbadịgo Magazine.

Onwuejeogwu, M.A, (1975). The social anthropology of African: An introduction. Ibadan: Heinemann Education Books.

Opata, D.U. (1998). Essays on Igbo world. Nsukka: AP Eụpress.

Parrinder, E.G. (1976). African traditional religion. London: Sheldon.

Parsons, T. (1977). On building social system theory: a personal history. In T. Parsons (Ed). Social system and evolution of action theory (pp. 22-76). New York: Free Press.

Radzilani, M.S. (2010). Discourse analysis on performance of bereavement ritual. Portharcourt paragraphics.

The Krikpe Center 14:1-13.The Main-ijo of western Niger Delta of Nigeria. In S. Okodudu(Ed). Selected through cultural studies and relevant training. The Business Review, 5(2),

Sossou, M.A.(2002). Widowhood Practices in West Africa: The silent victims. International Journal of Social Welfare,11(3), 201-209.

Tylor, E.B. (1891). Primitive culture. London: John Murray.

Udo, C. (2000). Death and dying education. Ibadan. Stirling. Hurden pub .

Ukagba, G.U. (Ed): (2007). The Kpim of death. Essays in memory of Rev. Fr. Prof. Panteleon Iroegbu. Canada Trafford Publishing.

Umoh, D, (2012). Death is not natural: The African story of religion and ociety. West Publishing Company.

Downloads

Published

2023-12-31