NTỤLEKỌRịTA "NA" N'ỤTỌASỤSỤ IGBO IZUGBE NA OLUNDỊ OWERE
Abstract
Ụmịedemede: ‘Na’ so n'otu ihe ọmụmụ nke onye ọbụla na-amụ asụsụ Igbo izugbe ga-ezuterịrị. Ọtụtụ mgbe ọ na-adị mfe iji ya eme ahịrịokwu n’ọsụsụ mana ọ naghị adị mfe ide ya ede n’ihi e nwere usoro dị iche iche a na-agbaso were ede ya. Etu e si ede ya mgbe ọ na-arụ ọrụ dị ka njikọ, nnyemakangwaa, mbuụzọ, isingwaa dg dịcha iche iche. A hụtara na ọ bụghị ụzọ e si eji “na” eme ahịrịokwu n’Igbo izugbe ka e si eji ya eme mgbe niile n’olundị Owere. Nke a kpalitere nchọcha a. A chọrọ ịchọpụta ebe dị iche iche a na-enweta myiri maọbụ ndịiche n’etiti Igbo izugbe na olundị Owere. Iji mee nke a, anyi ji atụtụ adịmịiche Lado (1957) mee nsekasị. A chọpụtara na ndị Owere nwere ụzọ dị iche iche ha si ezipụta iji “na" eme ahịrịokwu dịwaga iche na nke Igbo izugbe nke bụ ka asụsụ epum ha si kwado, nke abụghị nsụjọ. E nwekwara ebe iji “na” eme ahịrịokwu n’olundị Owere yiri nke Igbo Izugbe. Nchọcha a ga-eme ka onye nkụzi mara etu ọ ga-esi wee kụziere onye na-asụ olundị Owere dịka asụsụ nke mbụ ọrụ “na” na-arụ n’Igbo izugbe; ọ ga-emekwa ka nkụzi na ọmụmụ “na” dị mfe. Nchọcha a ga-emekwa ka a mata na a na-enweta ụdị ndịiche a n’olundị dị iche iche, tinyere ime ka ndị ọzọ cheta ime ụdị nchọcha a n'olundị ndị ọzọ.
References
Akidi, F.C. (2012). ‘Igbo language and its characteristics’. N’Ọja International journal of Igbo African and Asian Studies. Nnamdi Azikiwe University, Awka pp 212-219
Akidi, F.C. (2015). ‘Ụfọdụ aka mgba chere asụsụ Igbo’. Na Post Humans Festschriff in honour of Romans Obiora Ezeuko, S.I. Odinye, M.C. Egenti and D.M.A Orji (Eds) Pp 99-111 Onitsha: Djompol Int‟l printing and publishing Div.
Akidi, F.C. (2016). ‘Error analysis’. Na M. Mbah (Eds). Theories of linguistics. Nsukka: University press.
Anedo, O.A.A. (2014). Ndehie n‟ide asụsụ Igbo na ụfọdụ ihe ọmụmụ ụtọasụsụ Igbo. Awka: Besiry Books multipurpose publications.
Anyachọnkeya, N. (1998). ‘Contrastive analysis and Teaching of English’. Na Fundamentals of Teaching and learning methodology. Pp7378.
Apakama, L.M. (2006). Ndụbata N‟ụtọasụsụ Na Ụdaasụsụ Igbo Owerri: Divine Mercy.
Echebima, G. (2013). A Textbook of Igbo Grammar. Owerri: Asumpta press.
Emenanjo, E.N. (1991). Nchikọta asụsụ na ụtọasụsụ Igbo Izugbe maka Sekọndịrị.Lagos: Longaman Nigeria.
Ezeomeke, S.O. (2004). Igodo Nghọta ụtọasụsụ Igbo. Enugu: EasyỌuality press
Hartman, R. K.K. & Stork F.C. (1972). Dictionary of language and linguistics. Amsterdam: Applied Science.
Mbah, B.M. (1999). Studies in Syntax Igbo phrase structure. Nsukka: prize publishers.
Mbah, B.M. (2010). ‘Category incorporated preposition in Igbo’ Na C. Uchechukwu & B.M Mbah (Eds). Igbo language studies series 1. The preposition in Igbo. Onitsha: Edmail publication Pp 26-45.
Mbah, B.M., Mbah, E.E., Ikeokwu, E.S., Okeke, C.O, Nweze, I.M., Ugwuoma, C.N. Akaeze, C.M., Ọnụ, J.O., Eze, E.A., Prezi, G.O. & Odii, B.C. (2013). Igbo Adị Igbo-English, English-Igbo dictionary of linguistics and literary Terms. Nsukka: University of Nigerian press.
Nwaozuzu, G.I. (2005). Dialects of Igbo. Nsukka: University of Nigeria press.
Obadan, M.I. (2016). ‘Contrastive analysis’ na B.M Mbah (Ed). Theories of linguistics. Pp182-196. Nsukka: University press.
Okafor, C.U. & Ewelukwa, U. (2012). Nhazi asụsụ Igbo maka ule sịnịo sekọndịrị na Koleji, WASSCE, NECO, GCE, JAMB. Onitsha: A.C global publishers.
Okere, F.O. (2017). Ndehie na nke ụmụakwụkwọ ngalaba amụma asụsụ ala Naijiria na Linguistics, Alvan Ikoku Federal Kọleeji Keedukeshọn Owere. Semina maka ntozu oke inweta Ph.D Ọka: Mahadum Nnamdi Azikiwe.
Okoro, L.C. (2011). Mkpanaka onyenkuzi. Owerri: Ark publishers.
Udemmadụ, T. & Chinyeaka, L. (2017). ‘A contrasitive study of English and Igbo structures. A challenge to an Igbo ESL’. Na interdisciplinary journal of African and Asian studies volume 1 No. 3. www.ijaasng.com pp 103-113.
Umeodinka, A. U. & Ogwudile, C.E.C (2107). ‘The contrastive study of Igbo and English Denominal nouns’. Na Unizik, Journal of Arts and Humanities. (UJAH) ISSN: 1413, special Edition http://www.ajol.info/indeụ.php/ajah/indexPp 406-431.