ỌNỌDỤ NSỌKWỤNYE N’USOROOKWU N’OLU ỤMỤAHỊA
Abstract
N’ụtọasụsụ Igbo, nsọkwunye bụ otu n’ime isiokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ pụtara ihe. Nsọkwunye bụ otu n’ime nkejiasụsụ nke nwere ike iso ngwaa. Ọ na-etinyekwu nghọta n’okwu ọbụla ọ na-eso. E nweela ọtụtụ ndị mmadụ, ọ kachasị ndị odee nakwa ndị ọkammụta ndị deela ma mekwaa nchọcha gbasara ya. Nchọcha nke a tinyekwuru aka na nnyocha nsọkwụnye: Ihe ọ bụ, ụdị ọrụ ọ na-arụ, ọmụmaatụ ya dị icheiche nakwa ọnọdụ ya n’usoro okwu Igbo n’olundị Ụmụahịa. E sitere n’akwụkwọ dị iche iche nakwa okwu ọnụ ndị mmadụ bụụmụafọ Ụmụahịa biterela ọtụtụ afọ n’Ụmụahịa wee nwete ngwa nchọcha. E ji atụtụ echiche nhazi asụsụ na usoro nkọwasị wee tụchasịa ngwa nchọcha a. Nsọkwunye na-agbatịkwu nghọta dị n’ahịrịokwu, ọnọdụ ya n’ahịrịokwu na-egosi ụdị nsọkwunye ọ bụ. Na mmechi, a chọpụtara na nsọkwunye nwere ike ịnọ ọnọdụ ọbụla n’usorookwu Igbo. Ha nwere ike ịnọ na mbido, etiti maọbụ na ngwụcha usorookwu. Nsọkwunye anaghị agbanwe mpụtara dị n’okwu ma ọ bụrụ na e wepụ ya n’ahịrịokwu, kama ọ na-etinyekwu nghọta n’okwu.References
Anajemba, E.N. & Mbagwu, D.U. (2023). Enclitics in Igbo and Chinese: A comparative analysis. Awka Journal of Linguistics and Languages, 1. 85-106.
Anigbogu, P.N.; Mbah, B.M. & Eme, C.A. (2001). Introduction to Linguistics. Awka: JFC Ltd.
Emenanjọ, E.N. (1978). Element of modern Igbo grammar. Ibadan: University press.
Emenanjọ, E.N., Okolie, O.O. & Ekwe, B.U. (2004). Igbo maka sinịọ sekọndịrị (2). Ibadan: University press.
Ezeomeke, S.O. (2004). Igodo nghọta ụtọasụsụ Igbo. Enugu: Easy-ọuality press.
Green, M.M. & Igwe, G.E. (1963). A descriptive grammar of Igbo. London: Oụford University press.
Ikekọnwụ, C., Ezikeojiakụ, P.A. & Ugoji, J. (1999). Fọnọlọji na ụtọasụsụ Igbo. Lagos: Longman.
Karị, E.E. (2002). Distinguishing between clitics and affiụes in Degema, Nigeria. African study monographs, 23(3), 91-115
Mbah, B.M. na Mbah, E.E. (2014). Atụtụ amụmamụ asụsụ. Nsụka: University of Nigeria Press.
Ndimele, O.M. (1999). Morphology and Syntaụ. Port Harcourt: Emhai printing & publishing Co.
Nwozuzu, G.I. (2017). Dialects of Igbo Language. Nsukka: University of Nigeria press.
Nzidiegwu, B.I.; Okonye-Ogbalu, F.S. na Ofoegbu, N.K. (1997). Ọgbara ọhụrụ ụtọasụsụ Igbo maka jinịọ sekọndrị. Onitsha: Harton Publishers.
Ofomata, C.E. (2004). Ndezu ụtọasụsụ Igbo nke ndị sinịọ sekọndịrị. Enugu: Format publishers.
Okafọ, C.U. & Ewelukwa, U. (2008). Nhazi asụsụ Igbo maka ule sinịọ sekọndịrị na kọleeji W.A.S.S.C.E, N.E.C.O., G.C.E., J.A.M.B. Onitsha: A.C. Publishers.
Udemmadu, T. & Anidobe C.J. (2017). On Englitics in the Igbo Language. Preori Journal of Arts and Humanities 2(2), 1-6.
Udemmadu, T.N. & Egwuonwu-Chimezie, G.N. (2022). Ụtọasụsụ na Usorookwu Igbo. Grama na Sintasks Igbo. Onitcha: Durability Press
Ume, I.A., Ugorji, J.U. & Dike, G.A. (2015). Ụmị nkọwa ụtọasụsụ Igbo. Onitsha: Kawuriz & Manilas publishers.
Ugwuona, C.N., Nwankwo, O.A. & Nweze, M.I. (2020). Ntọala na Isiokwu ụfọdụ na Fọnọlọji Igbo Tinyere Olundi. Enugu: University of Nigeria Press.